NNPC petrol price discount: Ihe di n'ime 'onyinye' mmanụ ụgbọala gọọmenti Nigeria na-enye ụmụafọ ya

Ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Company, (NNPC) .
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Gọọmenti Nigeria ekwuola na ha ga-ebudata ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Nigeria n'ime ụbọchi iri atọ atọ site n'ụlọọrụ ha na-ere mmanụ ụgbọala bụ Nigerian National Petroleum Company (NNPC).

Mịnịsta na-ahụ maka akụnaụba bụ Taiwo Oyedele kwupụtara nke a n'Abuja n'ụbọchị Tọzde 9 Ọktoba 2026 ma sị na ha anaghị eweghachite ego enyemaka mmanụ ụgbọala a kpọrọ 'subsidy' bụ nke ha wepụrụ n'afọ 2023.

Kama o kwuru na gọọmenti ga-enye NNPC ohere ka ha ree mmanụ ụgbọala n'ọnụego ha zụtara ya n'ime ụbọchị iri atọ site n'iwepu uru ha na-erite n'ire mmanụ ụgbọala.

Ha kwuru na ndị ga kachasị rite uru n'atụmatụ ahụ bụ ndị ọrụ njem ụgbọala, na nke a bụ mbọ ọhụrụ gọọmenti na-agba iji belata ahụhụ ndị Nigeria na-ata n'ihi oke ọnụahịa mmanụ ụgbọala nakwa ime njem.

akụkọ ka na-abịa...