Etu mmadụ anọ si nwụọ ebe ọtụtụ merụrụ ahụ ka ụgbọmmiri ndị njem kpuru na Bayelsa state

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii ekwuola na mmadụ anọ, gụnyere ụmụaka abụọ, anwụọla mgbe ụgbọmmiri ndị njem bu ndị na-eru uju gaa emume olili ozu nke kpuru na Bayelsa state dị na ndịda Nigeria.
N'ozi ndị uweojii wepụtara na mgbede Fraịde ka ha kwuru na a zọpụtala mmadụ iri abụọ na anọ, ebe ọrụ gbatagbata na-aga n'ihu iji zọpụta ndị njem ndị ọzọ.
Ha kwuru na ihe mberede ahụ mere n'ihe dịka elekere iri na otu nke ụtụtụ (10:00 GMT) n'ụbọchị Fraịde 20 Nọvemba 2026 na njikọ osimiri dị n'etiti obodo Oweikorogha na Otuan na mpaghara okpuruọchịchị Ijaw.
Ha kọwara na ụgbọmmiri ahụ si Ayama na-aga Ukubie maka emume olili ozu mgbe a kọrọ na ọ nwere nsogbu n'igwe e ji akwọ ya.
A kọkwara na ụfọdụ ndị njem gwara onye ọkwọ ụgbọmmiri ahụ ka ọ kwọọ ụgbọmmiri gaa n'akụkụ osimiri, mana onye ahụ gara n'ihu na-akwọ ụgbọmmiri ahụ tupu ụgbọmmiri ahụ ekpuo.
Ndị uweojii kwukwara na ha amalitela ime nnyocha iji chọpụta ihe ndị merenụ.
Ka ọ ugbua, e burula ozu anọ ahụ a chọtara gaa n'ebe a na-edebe ozu na Federal Medical Centre dị na Yenagoa, isiobodo steeti ahụ.
N'ime mmadụ iri abụọ na anọ ahụ gbanarịrị ihe mberede ahụ, e bugara mmadụ iri na itoolu n'ụlọọgwụ Ayama, ebe e bugara mmadụ ise merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ Family Care dị na Yenagoa maka ọgwụgwọ.
Ndị uweojii kwuru na ndị njem ndị ọzọ a zọpụtara alaghachitela n'obodo ha.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
A kọkwara na onye na-anya ụgbọmmiri ahụ, nke e ji Omovie mara, gbara ọsọ dịka ndị uweojii kwuru na ha ejidela onye na-elekọta ụgbọmmiri ahụ ka nnyocha na-aga n'ihu.
E kwuru na ndị na-egwu mmiri n'ogbe ahụ, ndị uwe ojii na ndị ọzọ na-agba mbọ iji hụụ na ọrụ gbata gbata gara nke ọma maka ịnapụta dị ihe mberede ahụ metụtara.
Bayelsa state dị na mpaghara Niger Delta bụ mpaghara bara ọgaranya na mmanụ agbịdị na Nigeria, mpaghara nwere ọtụtụ osimiri na iyi.
Ụgbọmmiri bụ isi ihe eji eme njem n'ọtụtụ obodo na steeti ahụ.
A na-ahụkarị ihe mberede ụgbọmmiri na Nigeria, nke a na-ejikọkarị n'ibu ọtụtụ mmadụ, ụgbọmmiri ndị a na-anaghị elekọta nke ọma na enweghị ike idebe iwu nchekwa gbasara njem ụgbọmmiri.
Ndị uwe ojii agwaala ndị na-arụ ọrụ ụgbọmmiri ka ha zere ibu ibu n'ụgbọmmiri ha ma hụ na e nwere uwe nchekwa bụ jaket ma yiri ya nke ọma.
Ha dụrụkwa ndị njem ọdụ ka ha sie ike n'usoro nchekwa dị mkpa tupu ha amalite njem ụgbọmmiri.

























