Akụkọ dị mkpa - Ọgọst 24, 2026
Akụkọ dị mkpa - Ọgọst 24, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi na Naịjirịa bụ Mohammed Idris adọọla aka na nti megide ndị na-akpọ oku ka gọọmentị weghachịte ego enyemaka ha na-akwụ maka mbelata ọnụego mmanụ ụgbọala a kpọrọ 'fuel subsidy'.
- Idris kwuru na ọ bụrụ na eweghachịte 'subsidy' na ọ ga-adọla akụnaụba Naịjirịa azụ n'ụzọ ọjọọ gaa n'etu ọ dịbu n'afọ 2022 tupuu onyeisiala Tinubu ewepụ ya.
- Opekatampe ihe ruru mmadụ iri atọ anwụọla ebe ọtụtụ merụrụ ahụ dịka mgbidi unyi e kpofuru ekofu dagidere ọtụtụ ụlọ obibi dị n'obodo Conakry nke mba Guinea dịka gọọmentị ha si kwuo.
- E zigaala ọtụtụ ndị ọrụ gbata gbata n'ebe ihe a mere iji chọpụta ndị ka tọọrọ n'ime unyi ahụ dara n'elekere abụọ nke ụtụtụ dịka nnukwu mmiri zochara n'ime abalị.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






