Festus Oshabah Ferotex: Gọvanọ Peter Mbah na dị ọzọ atụọla arịrị maka ọnwụ ọrụụzọ a n'ihe mberede okporoụzọ

Ebe foto si, Peter Mbah/X
Arịrị na eye mmiri ejula ọtụtụ ụmụafọ Nigeria ọkachasị ndị ọwụwa anyanwụ dịka otu onwe nwere agba mabụụkwa onye nwe ụlọọrụ na-arụ okporoụzọ akpọrọ Ferotex Constructions.
Ichie Festus Oshaba-Onuh,nwụrụ ụbọchị Tọzde, abalị 19 nke ọnwa Novemba na ihe mberede okporoụzọ mere n'okporoụzọ si Enugu -gawa Port-Harcourt, dịka gọvanọ Enugu State bụ state ya si kwuo n'ozi o wepụtara n'akara ọbaozi ya na X a mabụ dịka Twitter n'ụt utụ Fraide.
Ozi ahụ sịrị,"Ọ bụ na nnukwu obi mwute ka m ji nweta ozi mgbawaobi maka ọnwụ nwanne anyị nwoke bụ Ichie Chief Festus Oshaba-Onuh n'ihe mberede okporoụzo n'okporoụzọ wara awara si Enugu gawa Prota-Harcourt."
Gọvanọ Mbah gara n'ihu kọwaa Oshaba dịka, "onye na-emere ọha ọgọ, onye hụrụ ala na ya naya nakwa onye nwere mmasị n'ọganihu nke Enugu State site na inye aka na mwulike ewumewu na-enyere ndụaka na state anyị"
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
N'otu aka ahụ , Senatọ n-anọchite n'Enugu-West bụ Osita Ugwu tụrụ arịrị sị, Onye nwere obi inyere ndị obodo anyị aka efunarịla ndị Enugu".
Ọ gara n'ihu kpee ekpere ka Chukwu kasie ezinaụlọ ya , ndị enyi na ndị obodo ndị Enugu Ezike n'oge ihe mgbu nke a.
Ihe ndị ị maghị maka Oshaba

Ebe foto si, Felix Oshaba/Screengrab
Felix Oshaba bụ onye obodo Umuagama dị n' Enugu-Ezike n'okpuru ọchịchị Igbo-Eze North n' Enugu State.
Ọ b u onye ọrụ ebere ji ego ya enyere ọha ndị mmadụ aka site n'ụlọọrụ ebere ọ kpọrọ 'Ferotex Empowerment Foundation'.
Oshaba bụ onye hụrụ egwuregwu n'anya ma jirikwa ego ya akwado egweuregwu ma n'obodo ya nakwa na steeti ya gụnyere otu egwu ball, Rangers Football Club .
Ọ bụ onye nhazi ego nke otu achụmtavootu APC n' Enugu State,





























