Ihe i kwesịrị ịma gbasara mbinye ego ụlọ nke gọọmenti Nigeria

Ebe foto si, Tinubu/X
- Onye dere ya, Nabeela Mukhtar Uba
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist Team Manager
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Onyeisiala Nigeria bụ Bola Ahmed Tinubu ekwupụtala na ndị Nigeria tozuru oke ga-enwe ike ịgbazite ego ụlọ ruru nde naira 100 n'oge na-adịbeghị anya.
Nke a na-abịa dịka ụmụafọ Nigeria na-agabiga ụkọ ụlọ nke ruru nde iri na ise n'etiti ndị bi na mba ahụ.
Onyeisiala Tinubu kwupụtara nke a n'akara soshal midịa ya, ma kwuo na atụmatụ a bụ iji mmụbanye ohere ịnweta ụlọ ma mee ka ndị Nigeria nwee ike inwe ụlọ.
Na Nigeria, ohere ịnweta ụlọ aghọwo nnukwu ihe ịma aka nye ndị na-enweghị ego na mba ahụ, ebe ihe owuwu na-aghọ ihe dị oke ọnụ, ọkachasị ugbua atụmatụ gọọmenti anaghị enye ụlọ dị ọnụ ala.
Kemgbe Onyeisiala Tinubu banyere n'ọchịchị, ọtụtụ atụmatụ akụnaụba o wepụtara na-akpalite oke ọnụ ahịa ngwaahịa n'akụkụ niile.
N'oge na-adịbeghị anya, Onyeisiala Tinubu ewepụtala ọtụtụ atụmatụ dị iche iche iji nye ụmụafọ Nigeria enyemaka, mana ọtụtụ ndị ma ihe ekwe na-akụ na-ekwu na ọ bụ maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị dịka ntuliaka afọ 2027, na-abịa nso.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Lee ihe i kwesịrị ịma gbasara mbinye ego ụlọ a
* Usoro mgbazinye ego a nọ n'okpuru ụlọọrụ Housing Investment Fund, bụ otu ego ruru ijeri naira nke na-enye ego mgbazinye maka ndị chọrọ ịzụ maọbụ ịrụ ụlọ ogologo oge na ọnụego ọmụrụ nwa nke pasent 9.75.
* Ndị tozuruoke irite uru na atụmatụ a ga-akwụrịrị ụgwọ mbụ nke pasent 10 nke ọnụ ahịa ụlọ ahụ ha chọrọ ịzụ, ebe onye dị otu ahụ nwere nhọrọ ịkwụ ụgwọ ụlọ ahụ n'ime afọ 20.
* Gọọmenti wepụtara atụmatụ ahụ iji nyere ụmụafọ Nigeria na-enweghị ego ịkwụ ụgwọ ụlọ ha chọrọ otu ugboro, aka.
Kedụ etu ụmụafọ Nigeria ga-esi enweta ego mgbazinye ahụ?
Ndị Nigeria, ọkachasị ndị ọrụ, na-enwe nnukwu nsogbu n'inwe ụlọ onwe ha n'ihi oke ọnụ ahịa ụlọ, mana Onyeisiala Tinubu kwuru na ya webatara atụmatụ a iji dozie nsogbu ndị ụmụafọ Nigeria na-enwe n'inweta ụlọ dị ọnụ ala site n'atụmatụ ịkwụ ụgwọ ogologo oge.
N'ozi Onyeisiala Bola Tinubu wepụtara n'akara X ya, ka o ji ụlọ ọnụ ego ya ruru nde 10 wee mee ọmụmaatụ, o kwuru na onye chọrọ ịzụ ụlọ dị otu a, ga-ebu ụzọ kwụọ ego mbụ ruru otu nde, tupu ọ malite ịkwụọkwa ego ruru ọnụ ego 85,400 naịra kwa ọnwa ruo afọ 20.
Onyeisiala Tinubu kwuru na ihe karịrị ndị Nigeria 2,300 si na steeti 27 enwetawo ụlọ ọnụ ego ha ruru ijeri naịra 160 site n'atụmatụ MOFI Real Estate Investment Fund (MREIF).
O kwukwara na ụmụafọ Nigeria tozuruoke ga-enwe ike irite uru n'agbanyeghị ebe ha bi ma ọ bụ ọnọdụ ha.
Tinubu kwuru, sị, "Ịkwesighi ịma minista, gọvanọ ma ọ bụ onye ọ bụla nọ n'ọchịchị iji rite uru n'ohere ndị a."
Dịka o si kwuo, "Atụmatụ a bụ maka ndị Nigeria tozuruoke, ebe ọ bụla ha nọ,"
Ụzọ ndị ọzọ ụmụafọ Nigeria ji enweta mgbazinye ego ụlọ
Cheta na ụlọakụ Federal Mortgage na-enye ndị zụrụ ụlọ ego ruru nde N50 na ọnụego ọmụrụ nwa nke pasentị isii.
Ndị gbaziri ego site na ụlọakụ a ga-eji afọ iri atọ jiri nwayọ kwụọ ụgwọ niile nke ụlọ ahụ.
Ọzọkwa, ndị Nigeria nọ n'atụmatụ ezumike nka nwere ike iji pasentị iri abụọ na ise (25) nke ego ezumike nka ha chịkọtara n'ime afọ ọrụ ha maka ịkwụ ụgwọ tupu ụtụisi, mana dabere n'ụzọ iwu wepụtara.
Ndị lụrụ di na nwunye nwekwara ike itinye akwụkwọ maka mgbazinye ego site na ijikọ aka na ndị mmekọ ha iji mee ka ohere ha nwere inweta mgbazinye ego ahụ dịkwuo elu.

























