Gọọmenti etiti Nigeria ọ chọrọ ịmanye 'ụtụisi' na mmanụ ụgbọala?

Ebe foto si, Getty Images / Taiwo Oyedele/ X
Ọ bụ eziokwu na Gọọmenti etiti Nigeria nwere atụmatụ ịmanye ụtụisi ọhụrụ n'ọnụego mmanụ ụgbọala?
Nke a bụ ajụjụ dị onye ọbụla n'ọnụ ugbua dịka Taiwo Oyedele bụ Mịnista na-ahụ maka ego na akụnaụba nakwa otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị African Democratic Congress, ADC na-akatọ onwe ha maka atụmatụ ahụ.
N'akụkọ a anyị tinyere anya n'ihe Mịnịsta Taiwo Oyedele kwuru nso nso a maka atụmatụ ahụ bụ ihe mere otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ADC ji na-adọ aka na ntị banyere ya.

Ebe foto si, Getty Images / Taiwo Oyedele/ X
Gịnị ka Taiwo Oyedele kwuru nke na-ese okwu?
N'oge a na-agba Taiwo Oyedele ajụjụọnụ n'ụlọọrụ mgbasaozi Arise News, o kwuru na "mba niile nọ n'ụwa nwere atụmatụ ụtụisi ha manyere na mmanụ ụgbọala".
"I lee anya n'ụwa, bido na 20% ruo 80% ọnụego mmanụ ụgbọala bụ ụtụisi dị iche iche".
"Ọtụtụ mba nọ n'Afrika nwere ụdị ụtụisi dị iche iche ruru iri ha na-amanye n'ọnụego mmanụ ugbọala".
"Mana ọ bụ n'oge anyị na-eme 'subsidy' ka anyị ga-etinye ụtụisi na mmanụ ụgbọala? Onweghi isi maka na ọ bụ gọọmenti ka ga-akwụ ya".
"Ọzọ bụ na i wepụ 'subsidy' ị gaghị amanye ụtụisi na mmanụ ụgbọala ozugbo ozugbo, nke ahụ adịghị mma maka na ọ ga-enye ndị mmadụ nnukwu nsogbu".
"N'oge dị mma, mgbe anyị doziri akụnaụba, mgbe ego ndị mmadụ na-enwete nwereike ịnabata ya; ụtụisi ndị ahụ ga-abịa".
"Ọ bụghị na anyị chọrọ ịmanye ụtụisi kama, ọ bụ maka na ego si n'ụtụisi ahụ ga-abanye n'ịrụ okporoụzọ".
"Anyị ga-eji ya na-ebulite ọdọ nchekwa mmanụ ụgbọala anyị. Jiri ya nye aka na-eme ka ọnụego mmanụ ụgbọala hapụ ịrị elu karịa".

Ebe foto si, Getty Images
Ịdọ aka na ntị otu ADC dọrọ maka ya
Otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị African Democratic Congress (ADC) dọrọ aka na ntị sị na "Gọọmenti Bola Tinubu ga-amanye ụtụisi n'ego mmanụ ụgbọala ma bulie ọnụego ya karịa N1500 ma ọ bụru na o merie na ntuliaka ụgbọala n'afọ 2027".
ADC na-ekwu nke a maka ihe mịnịsta na-ahụ maka ego na akụnụba bụ Taiwo Oyedele kwuru mgbe ọ sị na gọọmenti ga-amanye ụtụisi n'ọnụego mmanụ ụgbọala mgbe akụnaụba ga-adị mma.
Mana odeakwụkwọ ADC bụ Mallam Bolaji Abdullahi kwuru na "ebumnobi gọọmenti bụ ịmanye ụtụisi na mmanụ ụgbọala ma ha merie na ntuliaka 2027".
"Ha emeela iwu ịmanye ụtụisi 5% n'ọnụego mmanụ ụgbọala. Onyeisiala Bola Tinubu ebinyela aka na ya kemgbe June 2025. Ha ebidobeghị ịnara ego ụtụisi ahụ bụ maka ntuliaka na-abịa abịa, ọ bụrụ na ha merie ha ga-ebido ya dịka ha si bido 'fuel subsidy' n'afọ 2023".



























