National Youth Service Corps: A kpụpụla mmadụ ise a na-enyo enyo maka ntọrị ndị NYSC n'Imo State n'ụlọikpe

Ebe foto si, NTA
Ndị ọrụ nchekwa anwuchiela ma kpụpụ mmadụ ise a na-enyo enyo maka ntọrị ndị na-aga ime National Youth Service Corps n'ụlọikpe dị n'Owerri.
Ndị ọrụ nchekwa Department of State Services (DSS) kpụpụrụ ndị a n'ihu Ọkaikpe Emeka Uzoma Orafu nke Ụlọikpe Ukwu dị n'Owerri, Imo State.
Cheta ndị ntọrị tọọrọ mmadụ ruru iri abụọ nke ọtụtụ n'ime ha bụ na-aga ime NYSC n'obodo Umunoha nke okpuruọchịchị Mbaitoli n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba 2026.

Ebe foto si, Screen shot
Ụlọọrụ nchekwa DSS wepụtara aha ndị a dịka; Mohammed Ali, Usman Aliyu, Babangida Aliyu, Ibrahim Lili, Aminu Haliru.
Mana ha akọwaala etu maọbụ usoro ha jiri nwuchie ndị a.
Nke a na-abịa dịka ha tọhapụchara ndị ntoroọbịa ahụ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba 2026 ka otu izuụka gachara.
Ezinaụlọ ụfọdụ ndị ha tọọrọ kwuru na ha kwụrụ ụgwọ tupu ụmụaka ha enwere onwe ha mana ndị ọrụ nchekwa ekwubeghi ihe ọbụla metụtara ịkwụ ndị ntọrị ahụ ụgwọ.

























