Gịnị gbanwerela kemgbe afọ isii e mechara ngagharịiwe EndSARS?

Ndị ji foto ha ji echeta ngagharịiwe EndSARS
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Tuzde 20 Ọktoba 2026 mere ya afọ isii ụmụafọ Nigeria n'ebe dị iche iche mere ngagharịiwe EndSARS iji kpọọ oku maka mkpagbu ndị ọrụ nchekwa SARS na-akpagbu ndị ntorobịa nakwa ịkpọ oku maka ezi nleta ndị uweojii.

Mana kedụ ka ngagharịiwe a si malite?

Mmalite ngagharịiwe EndSARS

Ụmụnwoke abụọ na-efe ọkọlọtọ Nigeria ma jiri akwụkwọ e dere EndSARS

EndSARS bụ ngagharịiwe ụmụafọ Nigeria jiri mee mkpesa megide mmekpaahụ ndị uweojii nakwa ụzọ na-ezighị ezi ha ji anapụ ndị mmadụ ego, anwụchi, emesi ndị mmadụ ike ma na-egbukwa ụmụ mmadụ n'ụzọ iwu na-akwadoghị.

Ọ bụ ngalaba ụlọọrụ ndị uweojii Nigeria hiwere iji buo agha megide mpụ na omekome a kpọrọ Special Anti-Robbery Squad (SARS), ka e lekwasịrị anya mee ngagharịiwe a.

Ọ bụ n'ogbe nzirịtaozi soshal midịa ka ọkpụkpọoku a gbapụtara ihe n'afọ 2017, mgbe ndị Nigeria ji "EndSARS" kpọọ oku ka e mechie ngalaba SARS.

Na-agbanyeghị oku ndị ha kpọrọ na mgbe gara aga ka a hazigharịa ngalaba ahụ nakwa nkwa gọọmenti kwere, ebubo mmetọ gakwara n'ihu na-arị elu.

N'ọnwa Ọktoba afọ 2020, ọkpụkpọoku a mawanyere njọ dịka otu onyonyoo fesara n'ịntaneetị n'ụbọchị 3 Ọktoba, ma gosi ebe a sị onye ọrụ SARS na-emetọ otu nwaokorọbịa ma na-agbakwa egbe n'Ughelli dị na Delta state.

Ọnọdụ a kpalitere iwe na ọnụma ebe niile nke mere ngagharịiwe jiri malite na Lagos state nakwa obodo ndị ọzọ dị na Nigeria n'ụbọchị 8 Ọktoba.

Ndị ntoroọbịa haziri ngagharịiwe site na soshal midịa, dịka ọnụụzọ Lekki Toll Gate bụ isi ọgbakọ ha. Ndị Nigeria bi na mba ọzọ hazikwara ngagharịiwe nke ha iji gosi nkwado.

Ihe ndị ha chọrọ

Nwoke ji akụkwọ e dere ihe ndị na-eme ngagharịiwe chọrọ ka gọọmenti mee

N'ụbọchị 11 Ọktoba 2020, ndị ngagharịiwe wepụtara ọkpụrụkpụ ihe ise ha chọrọ n'aka gọọmenti etiti.

Ịtọhapụ ndị ngagharịiwe e ji eji: Ha kpọrọ oku ka gọọmenti tọhapụ ndị niile a nwụchiri ma jichie n'oge ha na-eme ngagharịiwe.

Ikpe ziri ezi na iti aka n'obi: Ha kpọrọ oku ka e weta ikpe ziri ezi nye ndị niile ndị uweojii mekpara ahụ ma tiekwa ezinaụlọ ndị e gburu egbu aka n'obi.

Ka e hiwe otu nnyocha kwụụrụ onwe ya: Ha kpọrọ oku ka e hiwe otu nnyocha kwụụrụ onwe ya n'ime ụbọchị iri iji nyochaa mkpesa gbasara omume ọjọọ ndị uweojii ma kpee ndị uweojii aka ha dị na ya ikpe.

Ka e nyochaa ụbụrụ ndị uweojii ma zụgharịa ha: Ịnwale ma zụgharịa ndị bụbu ndị uweojii SARS tupu ezigaa ha na ngalaba uweojii ndị ọzọ.

Ka a kwalite ọdịmma ndị uweojii: Ha kpọrọ oku ka e bulie ụgwọọnwa ndị uweojii iji kwado ha ịrụ ọrụ ha dịka o siri kwesị.

Dịka ngagharịiwe fesara, ihe omume ahụ etoo karịa ihe ndị ha chọrọ na mmalite. Ndị ngagharịiwe jiiri oke olu kpọọ oku ka a hazigharịa ndị uweojii, ka gọọmenti nye ngụkọ, ka a kwanyere ikike dịịrị mmadụ nakwa ezi ọchịchị.

Ihe gọọmenti zaghachiri

Foto kọmitii e hiwere iji lebanye anya n'oku ndị ngagharịiwe kpọrọ banyere mkpagbu ndị ntorobị na-agabiga n'aka ndị uweojii SARS

Nzaghachi gọọmenti nyere jikọtara nkwupụta maka iweta mgbanwe nakwa usoro nchekwa nke ọtụtụ ndị ngagharịiwe na ndị na-akpọ oku maka ikike mmadụ katọrọ.

N'ụbọchị 11 Ọktoba 2020, Onyeisi ndị uweojii Nigeria kwupụtara na e kposaala ngalaba SARS. Ka o sina dị, ọtụtụ ndị ngagharịiwe enweghị afọ ojuju n'ihi na e kwupụtala ụdịrị ihe a n'oge gara aga. Nke a mere ha jiri chee na a ga-eziga ndị uweojii SARS na ngalaba ndị ọzọ karịa ileba anya na nsogbu ndị ha butere.

Ndị ọchịchị mechara kwupụta na ha emeela atụmatụ ihiwe ngalaba ọhụrụ a kpọrọ Special Weapons and Tactics (SWAT) ma wepụtakwa usoro iji tulee maka ịhazigharị ndị uweojii ma leba anya na mkpesa ndị ngagharịiwe.

Gọọmenti Lagos state kwere nkwa na ha ga-ekepụta akpaego maka nkasiobi ndị mmekpaahụ ndị uweojii metụtara.

Gọọmenti Lagos state kwere nkwa na ha ga-ekepụta akpaego maka nkasiobi ndị mmekpaahụ ndị uweojii metụtara.

Ka ọ dị, ndị uweojii ji anwụrụ anyammiri, egbe mmiri nakwa egbe mgbọ nọ n'ime ya chụsaa ndị ngagharịiwe dịka ụfọdụ siri kwuo.

A nwụchiri ụfọdụ ndị ngagharịiwe maọbụ merụọ ha ahụ ma nwetekwa akụkọ gbasara ọnwụ ndị mmadụ n'akụkụ Nigeria dị iche iche.

N'ụbọchị 19 Ọktoba, onyeisiala Nigeria n'oge ahụ bụ Muhammadu Buhari dọrọ aka na ntị na ụfọdụ ndị ala adịghị mma nwereike iweghara ngagharịiwe ahụ iji bute tigbuo zọgbuo.

Egbe a gbara na Lekki Toll Gate

Ndị uweojii bu egbe nọrọ na Lekki Toll Gate

Egbe a gbara n'ọnụụzọ Lekki Toll Gate dị na Lagos n'ụbọchị 20 Ọktoba 2020 bụụrụ ọgbaaghara akachasị echeta na ngagharịiwe EndSARS

N'abalị ahụ, ndị uweojii e zigara na mpaghara ahụ kwara mgbọ n'ebe ndị ngagharịiwe gbakọrọ n'ọnụụzọ ahụ.

Ndị hụrụ ka o si mee nakwa ndị isi ha pụtara kwuru na a gbara ndị ngagharịiwe egbe oge ha zukọrọ na mpaghara ahụ. Akụkọ kwuru na a gbanyụrụ igwe onyonyoo e ji amata ka ihe si eme nakwa ọkụ okporoụzọ ndị nọ na mpaghara ahụ tupu amalite ịkwa mgbọ.

Ndị obodo na ọha mbaụwa katọrọ ọnọdụ a ma jụọ ihe mere e ji were ndịagha busoo mmadụ nkịtị agha, bụ ndị na-egosipụta ikike ha inwe ọgbakọ udo.

Ọnọdụ butere ịkwa mgbọ ahụ, mmadụ ole e gburu nakwa ndị nchekwa gbara egbe a bụrụla isiokwu a kpụ n'ọnụ n'akụkọ nakwa nnyocha dị iche iche. Ndịagha Nigeria na gọọmenti agbaghaala ụfọdụ akụkụ ebubo a na-ebo ha.

Ndị o metụtara na ihe ndị si na ya pụta

Ngagharịiwe na ọgbaaghara ndị sochiri ya butere ọnwụ, mmerụahụ, nnwụchi nakwa mbibi ngwongwo gọọmenti na nke ndị nkịtị.

A nụrụ akụkọ gbasara ọnwụ ndị nkịtị, ndị ngagharịiwe, ndị uweojii na ndịagha n'akụkụ Nigeria dị iche iche.

N'ihi mgbọ a kwara na Lekki Toll Gate, ọgbaaghara tiwapụrụ n'ọtụtụ mpaghara dị iche iche. A wakporo ma mụnye ụfọdụ ụlọorụ ndị uweojii ọkụ, ọkachasị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Nigeria, tikaa ụlọmkpọrọ ma buru egbe ndị nchekwa.

Ụgwọ a kwụrụ ndị ọkaiwu: A nwụchiri ụfọdụ ndị ngagharịiwe ma mekpaa ụfọdụ ndị ọzọ ahụ.Akụkọ kwuru na a machiri akara akpaego ndị mere ngagharịiwe dị n'ụlọakụ, nke kpaliri ajụjụ banyere agwa a kpakwasịrị ndị na-akpọ oku nchkewa ikike dịịrị mmadụ.

Oku a na-akpọ maka ikpe ziri ezi: Ngagharịiwe kpaliri nrụrịtaụka banyere etu ndị uweojii si akpa agwa, nchekwa ikike dịịrị onye nakwa ọrụ dịịrị gọọmenti inyocha ebubo mkpagbu dị iche iche.

Usoro a na-emezughị: Mkposa SARS n'onwe ya emezighị echiche ụfọdụ nwere banyere akparamagwa ndị uweojii. Ntule LSE e mere kwuru na ihe ga-eweta ezi mgbanwe bụ atụmatụ na usoro zuruoke, ezi nleta nye ndị uweojii nakwa ọzụzụ banyere nhcekwa ikike dịịrị onye.