Jimmy Odukoya: Fountain of Life, Assemblies of God na ụka ndị ọzọ esemokwu dapụtara dịka onye hiwere ụlọụka nwụrụ

Ebe foto si, Taiwo Odukoya/Assemblies of God/Screengrab
Esemokwu dapụtara n'ụlọụka 'Fountain of Life Church' Lagos awarala ọgọdọ dịka ụlọikpe Ukwu nke Lagos State nyere iwu ka ọkpara onye nwe ụlọụka ahụ bụ Jimmy Odukoya kwụsị ịkpọ onwe ya onyeisi ụlọụka ahụ.
Nke a na-abịa dịka jimmy Odukoya jụrụ irubesi na ntuziaka ndị isi ụlọka ahụ nyere ya ka ọ rịtuo n'ọnwa ahụ ma nye ohere ka onye a sị nna ya họpụtara iwere ọkwa ahụ.
Akwụkwọ ikpe nke ndị ndu ụlọụka ahụ wepụrụ n'ụlọikpe ụbọchị Wenezde n'ihu ọkaikpe O.O. Adewunmi-Oshin, nke rutere BBC Igbo aka, rịọrọ ụlọikpe ka Jimmy Odukoya kwụsị ịkpọ onwe ya onyeisi ụlọụka ahụ dịka, "Onye hiwere ụlọụka bụ Taiwo Odukoya họpụtara onye ga-anọchi ya dịka ọ dị n'iwu ụlọụka ahụ.
Ọkaikpe Adewunmi-Oshin nabatara arịrịọ ha ma nye ha iwu ka ha zigara onye ha gbara akwụkwọ akwụkwọ ikpe ahụ.

Ebe foto si, Pastor Taiwo Odukoya/Facebook
Dịka akụkọCheta na Taiwo Odukoya hịwere ụka 'ounFtain of Life Church n'afọ 1992 , ya na nwụnye ya bụ Bimbo Odukoya.
Ọ nwụrụ n'ọnwa Ọgụstụ afọ 2023, ndị ndu ụka ya họpụtara nwa ya bụ Jimmy Odukoya ka ọ nọchie ya.
Mana na nsonso a, ha nyere ya ntuziaka rịtụọ dịka ha kwuru na ha hụrụ ihe onyonyo ebe Odukoya kpọpụtara aha Pastọ Kunle Areogun dịka onye ga-anọchie bụ nke ha sị na ha ahụghị oge ọ dị ndụ.
Akụkọ ahụ nke nke bụ okwu akpụ n'ọnụ abụghị mbụ esemokwu na-adapụta n'ụka Kraịstị na Nigeria banyere onye ga-anọchi onye ndu ụka oge ọ nwụrụ.
Lee ụfọdụ esemokwu metụtara ọkwa, akụ na ihe e nwe enwe ụka yiri ya merela:
1. Ụka 'Assemblies of God'

Ebe foto si, Asemblies of God/Website
Assemblies of God Nigeria bụ ụka a ma dịka 'nne ụka agba ọhụrụ' ( the Mother of Pentecostalism') na Nigeria bụ ụka m nke Augustus Ehurie Wogu na ndị kwere ekwe hiwere ) n'ọnwa Ọgụstụ afọ 1934 n'Ụmuahia.
Nke a bụ dịka ụka Faith Tabernacle ụka Wogu sibu ụka Anglikan banye, chụpụrụ ya n'ihi nkwenye ya na nkuzi ya ịsụ na ire ,ibu amụma na mkpụrụ nke Mmụọnso ndị ọzọ bụ nkwa na-emezu na ndụ ndị kwere eke n'oge ụgbua , na ọ bụghị naanị n'oge ndị ụmụazụ Kraịstị.

Ebe foto si, Assemblies of God/Facebook
Mana Ụka Assemblies abụghị ụka onye hiwere ya bụ Wogu jị ọchịchị dịka ụka ndị ọgbara ọhụrụ ndị ọzọ. Wogu abụghị ụkọchukwu e chiri echi kama ọ bụ nwoke ihe Chineke na-anọ ọkụ n'obi, hapụrụ ndị ọzọ ka ha na-edu ụlọụka ahụ malite n'agbata afọ 1945.
Nnukwu esemokwu dapụtara n'ụka ahụ nwere alaka ya na mpaghara dị iche iche na Nigeria oge ndịisi ụka ahụ gwara onye ndu ka oge ahụ bụ Rev Paul Emeka ka ọ rituo n'ọkwa n'ihi ebubo iji aka ike achị nakwa ebubo nrụụ aka ma nye iwu ka ụkọchukwu ọzọ ụkọchụku Chidi Okoroafo bụrụ onyeisi.
Ntuziaka ahụ butere okwu dịka Emeka jụrụ ma kpụpụ ndịisiụka ahụ ụlọikpe. Na-agbannyeghị.
Esemokwu akụ kewara ụlọụka ahụ n'etiti ndị kwụnyere Emeka na ndị kwụnyere Chidi Okoroafor ọbụladi na Okoroafo alaghachiela dịka onyeisi ụka ahụ..
2. Ụka 'Christ Apostolic Church'(CAC)
Apostle Joseph Ayo Babalola bụ onye hiwere ụka 'Christ Apostolic Church',CAC n'ịchafụ n'afọ 1941.
Dịka e siri mara Assemblies of God n'Ọwụwa Anyanwụ, CAC so n'ụlọụka a ma ama gbasara oziọma ụka agbara ọhụrụ n'Ọdịda Anyanwụ Nigeria.
Ụlọụka CAC kesara n'ibe, n'ibe dịka Babalola nwụchara n'ọnwa Julai afọ 1959 na-akpọpụtaghị onye ga-anọchi ya n'ihi ọzụzọ onye ga-ere ọkwa ọchịchị.
Ndị isi ụka họpụtara Onyeamụma David Olulana Babajide ka ọ nọchie Bablola dịka onyeiisi mgbasaoziọma rue afọ 1991 mana e nwere ndị chere na Onyeamụma Samson Akande bụ onye ya na Babalola nọkọrọ tupu ọ nwụọ kwesịrị ịbụ onye nwetara ọkwa ahụ.
Mana ọbụ na-agbata afọ 1991 ka esemokwu dị n'ụlọụka ahụ jirị kwaa ma yiri akpa ajị okwu metụtara afọ ole onyeis ga-anọ tupu ọla ezumike nka nakwa okwu metụtara ego. bụ nke kewara ụka ahụ abụọ.
3. Ụka Sabbath

Ebe foto si, Holy Sabbath of Christ (the king) Mission International/FAcebook
Ụka 'Holy Sabbath of Christ the King Mission' nke a ma dịka "Ụka Sabbath Musa' bụ sokwa otu n'ụka ndị nsogbu dapụtara dịka onye nwe ya nwụchara.
Rev. Michael Nwobi Amakaeze bụ onye ama dịka 'Onyeamụma Musa' bụ onye hiwere ụka ahụ na Nnobi Anambra state.
Esemokwu dapụtara dịka Rev Amakaeze nwụrụ n'abalị 30 nke ọnwa Disemba afọ 1995 n'etiti ezinaụlọ ya na ndị ndu ụka ahụ.
Nwa ya nwoke bụ Chidi Enyinnaya Amakaeze (Ben Aaron) weghara dịka onyeisi ụlọụka ahụ.
4. Brotherhood of the Cross and Star(Olumba Olumba)
Ụka'Brotherhood of the Cross and Star' nke Olumba Olumba Obu hiwere n'afọ 1956. danyere na Calabar danyere nnukwu esemokwu dịka onye du ụka ahụ nwụrụ n'ebe afọ 2000.
Ụmụ ya na ndị welitere isi n'ụka ahụ malitere ịzọ onye ga-anọchi nwoke ahụ nke ụfọdụ ndị ụka ya ekwenyeghị na ọ nwụrụ anwụ kama ọ gafere n'ala ndị anaghị ahụ anya.
5. Ụka 'Celestial Church of Christ'

Ebe foto si, Samuel Bilewu Joseph Oshoffa/CCC website
Ụlọụka 'Cele' bụ ụka e bidoro na Port Novo dị na mba Benin Republic so na ụlọụka ndị nwere nnukwu nsogbu dịka onye bidoro ụlọụka ahụ bụ Samuel Bilewu Joseph Oshoffa nwụrụ n'ihe mberede ụgbọala n'afọ 1985.
Oshoffa kwuburu na onye ga-anọchi ya ga bụ site na mkpughe, ọ bụghị site n' iwu ụka ahụ nke ụfọdụ chere mere ka e nwere ọtụtụ ndị dị iche iche .
Alexander Abiodun Bada bụ onye dị Oshoffa ghọrọ onyeisiụlọụka ahụ mana ụfọdụ ndị ọzọ welitere isi n'ụlọụka ahụ chọrọ ka ọ bụrụ ndị si n'ezinaụlọ Ọshoffa nọchie ya.
Okwu ahụ pụrụ ụlọikpe ma bute nkewa n'etiti ndị ụka ahụ na Nigerina, Benin nakwa ebe ndị ọzọ ha nwere alaka.
6. Ụka 'Church of the Lord' (Aladura)

Ebe foto si, The Church of the Lord, Uk/Website
Josiah Olunowo Ositelu bụ onye katikist n'ụka Anglikan bụ onye a sị na -ụka Anglikan chụpụrụ ya n'ihi ọhụrụ ọ hụrụ na ihe ọhụrụ ndị ọzọ ọ na-ekwupụta.
Ositelu gara hiwe ụka"Church of the Lord' n'afọ 1930 bụ nke mechara gbasaa n'ọtụtụ ebe n'Africa nakwa n'ụwa dịka Liberia, Sierra Leone, na Ghana.
Mana nnukwu esemokwu dapụtara n' ụka ahụ a ma dịka "Aladura' nke pụtara "Ụka Ekpere n'asụsụ Igbo, dịka Ositelu nwụchara n'afọ 1966.
Ihe na-ese bụ okwu o kwesịrị ịbụ ụmụ Ositelu mụrụ n'afọ ya ka ọ bụ ndị ụkọchukwu welitere isi n'ụka ahụ ga-eweghara ọkwa ịnọchị Ositelu.
Okwu ahụ pụrụ ụlọikpe ma butekwa nkewa n'ụlọụka ahụ.
7. Ụka Cherubim and Seraphim

Ebe foto si, Moses Orimolade/Screengrab
Ụka 'Cherubim and Seraphim Movement Church (CSMC) bụ ụka Moses Orimolade Tunolase hiwere n'afọ 1925.
Mana ụka ahụ malietere nwewe nsogbo oge Orimolade nwụchara n'afọ 1933 dịka e nweghị ntọala onye kwesịrị iweghara ọkwa nke mere ka nghọtahie n'alaka ụka ahụ dị ebe dị iche iche.
Otu onyeamụma nwaantị bụ Captain Christiana Abiodun Akinsowon kwuru na ikike mmụọ nke ụka ahụ dị ya n'aka.




























