Kwankwaso bụ onye haziri nlọghachi anyị n'otu APC, mana o mechara gbahapụ nkwekọrịta ahụ – Abba Yusuf

Ebe foto si, Abba Yusuf/Facebook
Gọvanọ Kano state bụ Abba Kabir Yusuf ekwuola na onye bụbu onye ndu ndọrọndọrọ ọchịchị ya bụ Rabiu Musa Kwankwaso so na ndị haziri nkwekọrịta ya na Onyeisiala Bola Tinubu maka ịlọghachi na pati 'All Progressives Congress' (APC), mana o mechara ghara imezu nkwekọrịta ahụ.
Yusuf kwuru nke a n'ajụjụọnụ ya na BBC Hausa nwere dịka ọ na-eru otu afọ ọ hapụrụ pati NNPP ma sonye otu APC bụ nke butere nsogbu ndọrọndọrọ ọchịchị dị n'etiti ya na Kwankwaso.
Gọvanọ ahụ kwuru na mkparịtaụka banyere ịlọghachi APC malitere obere oge ka o merichara ntuliaka gọvanọ afọ 2023 mgbe ọ na-eche ikpe e tinyere iji kagbuo mmeri ya ihu.
O kwuru na Kwankwaso gwara ya ka ọ gaa hụ Tinubu ma mee ka ọ mata na ndị otu Kwankwasiyya dị njikere ịlọghachi APC ma ọ bụrụ na gọọmentị etiti etinyeghị aka n'okwu ikpe ahụ dị n'etiti ya na onye ji ọkọlọtọ APC zọọ ọkwa gọvanọ bụ Nasir Yusuf Gawuna.
Yusuf kwuru, sị: "Ọ bụ ya zitere m ka m hụ Tinubu ma gwa ya nkwa ahụ. Ọ mekwara ka m ṅụọ iyi n'Akwụkwọ Nsọ Kọran na ma ọ bụrụ na Chineke enye anyị mmeri, anyị ga-adị n'otu ma lọghachi APC."
Ọ gbakwunyere na Kwankwaso mechara zute Tinubu ọtụtụ ugboro ma zipụkwa ndị nnọchi anya ka ha kpaa nkata banyere atụmatụ ahụ.
Yusuf jụrụ ebubo na ọ raara Kwankwaso nye site n'ịhapụ NNPP, ma kwuo na ọ bụ naanị ihe ha kwekọrịtara na mbụ ka o mezuru.
Nkwupụta Yusuf dị iche na ihe Kwankwaso gwara BBC, oge o kwuru mgbe Yusuf hapụrụ pati NNPP na ihe ahụ juru ya anya, nakwa na ọ maghị ihe kpatara esemokwu dị n'etiti ha.
N'agbanyeghị nghọtahie dị n'etiti ha, Yusuf kwuru na ya ebughị Kwankwaso iro n'obi nakwa na ha ka na-akparịta ụka mgbe ụfọdụ.




























