Mụ na Peter Obi hapụrụ ADC n’ihi na anyị na ha enweghị otu ụdị echiche

Aha onyonyo, Mụ na Peter Obi hapụrụ ADC n’ihi na anyị na ha enweghị otu ụdị echiche
Mụ na Peter Obi hapụrụ ADC n’ihi na anyị na ha enweghị otu ụdị echiche
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Onye dere ya, Abba Auwalu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Rabiu Kwankwanso bụ aka chịburu Kano steeti na osote Peter Obi maka ife ọkọlọtọ otu pati NDC na ntuliaka 2027.

Na mkparịtaụka ya na BBC News Igbo nwere n'ụlọ ya dị n'Abuja, na nsonso a, Kwankwaso katọrọ usoro ntuliaka 'direct primaries'.

"Amaghị m ihe mere na Ụlọomeiwu Naijirịa na Onyeisiala kpebiri ịkagbu ohere ndị a họro ahọro ịtụ vootu na ntuliaka imeụlo."

"Ntuliaka imeụlọ nke ndị a họpụtara na-atụ ezughị oke kama I lee anya n'ihe mere n'afọ1999 oge pati anyị bụ PDP mere ntuliaka imeụlọ nke ndị pati anyị niile sonyere, o nyere nsogbu."

"Ya mere, n'oge e mechara ya bụ ntuliaka nke afọ1999, anyị kpebiri ịgbanwe ya ka ọ bụrụ ndị a họpụtara ga-atụ vootu na ntuliaka imeụlọ."

"E lee ya anya , ọ dị mma n'ihi na o nyere ndị niile nọ na pati ohere ịga tụọ vootu, mana a sị ka e tinye ya n'ọrụ, ọ dabaghị."

Kwankwaso kọwara ihe mere ha ji hapụ ADC banye NDC na ihe ndị ọzọ.

Kirie ya n'uju n'ihe onyonyo a: