A na m enwe nsogbu ọkụ latrịk, enweghị mmiri na 'Presidential Villa' – Tinubu

Onyeisiala Nigeria, Bola Tinubu
Nkọwa foto, Bola Tinubu
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onyeisiala Bola Tinubu ekwuola na ya na-enwe nsogbu enweghị ọkụ latrịk, mmiri nakwa ụfọdụ nsogbu ụmụamaala Nigeria na-enwe.

Bola Tinubu kwuru nke a n'ọgbakọ o nwere na Lagos state n'ime abalị garaaga bụ ebe o zutere ndị eze obodo nakwa ndị isi okpukper dị icheiche.

Tinubu bụ onye tinyere ọnụ n'ihe dị iche iche banyere ọnọdụ nchekwa na mmepe obodo gwara ndị mmadụ ihe ọ na-agabiga n'obi ọchịchị onyeisiala Bekee kpọrọ Presidential Vila dị n'Abuja.

N'okwu ya "Ọ bụrụ na m nọtee aka na Legos state agaghị m achọ iji ọsọ ọsọ gaghachị Abuja.

"Mana ka m gwa ọtụtụ n'ime unu, n'ubochi Wenezde n'izu ụka gara-aga, a na m akpụchasị ajị n'ebe ịsa ahụ n'oge mmiri kwụsịrị ịgba.

"Nke a mere n'obi Ọchịchị Onyeisiala '(Presidential Villa)'."

"Ị maghị na ntaramahụhụ dị n'ebe ahụ kwa?. Mmiri kwụsịrị ịgba".

"Mana anyị ga-emezi ọnọdụ enweghị mmiri, enweghị ọkụ latrịk na-enweghi ezigbo mmepe obodo".

"Anyị ka na-ebido ebido, anyị ga-emewu ya ma meere ya ụmụ Nigeria".