Ihe NLC na ndị Ọwụwa Anyanwụ chọrọ n'aka gọọmentị dịka ọnụahịa mmanụ ụgbọala rịrị ruo N1400

Onye na-ere mmanụ ụgbọala

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu jịkọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Labour Congress (NLC) na ụmụafọ Naíjiria n'Ọwụwa Anyanwụ etiela mkpu banyere ọrịrị ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa.

N'ozi nke otu ahụ wepụtara n'ụbọchị Wenezde nke onyeisi ha bụ Joe Ajaero binyere aka, otu NLC kwara arịrị na ọnụahịa mmanụ ụgbọala eruola N1,430 maọbụ karịa ma rụtụ aka na nke a ebutela oke ahụhụ nye ọha ụmụ Naịjirịa dịka ọ metụtara ụgwọọnwa ndị ọrụ na ọnụahịa ihe na-ada n'ahịa.

NLC kpọrọ oku ka gọọmentị bulite ego ụgwọọnwa ndị ọrụ ma tinye ego nkwụbilata (subsidy) iji beleta ahụhụ ọha ụmụ Naịjiria.

Ozi ahụ gara n'ihu sị, "O nweghị mba na-egwupụta mmanụ na-enweghị ihe nkwụbilata ego ha na-enye ụmụ amaala ha."

Ọnụahịa mmanụ agbịdị rịrị na mbaụwa rue agbata dọla 35 na 40 maka otu barelụ n'ihi agha dị n'etiti Amerịka na Iran.

Ụgbọala na-ebu mmanụ ụgbọala

Mana dịka ya bụ ọrịrị ọnụahịa mmanụ agbịdị na mba ụwa bụụrụ ihe ọma nye gọọmentị Naijirịa dịka ego ha na-erete na mmanụ gbaliri elu, ọ ghọrọ ndị Naịjirịa ihe ahụ ụfụ dịka Naịjirịa ka na-atụbata mmanụ e sikara na mba ofesi ma na-eresịkwa ụlọọrụ ndị na-esika mmanụ na Naịjirịa n'ọnụahịa a na-ere ya na mba ofesi nke mere ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala gbalie elu.

Nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na mmanụ ụgbọala arịala ruo N1310 na N1500 n'Imo steeti; n'Ebonyi, a na-ere mmanụ ụgbọala n'agbata N1410 na N1450.

ụgbọala 'korope na ndị njem kwụ n'akụkọ okporoụzọ

Ọtụtụ ndị ọkwọụgbọala nọ n'Ọwụwa Anyanwụ na-akwa arịrị banyere ahụhụ ha na-agabiga n'ihi mgbali elu ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

Otu n'ime ha bụ Ifesinachi Adigwe bi n'Owere n'Imo Steeti, onye kwuru sị, na ọ zụrụ otu lita mmanụ N1500 mana ya gwa ndị njem kwụọ N250 maọbụ N300, ha na-ekwe ya ọnụ.

"Ha amaghị na ego mmanụ ụgbọala akarịala nke na anyị bụ ndị ọkwọụgbọala agaghị azụtalikwa ya ma ya fọdụ ibu ndị njem."

Ihe asaa NLC na-atụ arịrị ya ka o si metụta ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala

Joe Ajaero,Onyeisi otu NLC

Ebe foto si, NLC

1. Mgbali elu ego njem na-emetụtụta ihe niile gụnyere ụgwọ akwụkwọ, ụtụ, ego ụlọ, na nri.

2. Mgbali elu ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala na-ebute ihe isiwanye ike na ụbịam.

3. Ọ dị mwute na ụlọọrụ ndị na-esika mmanụ agbịdị na-atụbata mmanụ ha na-esika atụbata.

Ihe NLC chọrọ ka Gọọmentị mee:

4. Ka a malite ozugbo na-akwụ ndị ọrụ ụgwọọnwa dị mma.

5. Ka a malite iresị ụlọọrụ na-esika mmadụ agbịdị mmanụ na naịra.

6. Ka e wulite ite e ji echekwa mmanụ maka ọ dị na mkpa.

7. Ka e hiwe usoro mkwụbilata ego iji nyere ọha ndị mmadụ aka ọbụladị n'ụdị oge ihe isi ike.