Gọọmenti akwụsịtụla onyeisi ụlọọrụ NSCDC na Niger state ọrụ maka ọnwụ mmadụ 37

Suberu Siyaka Aniviye bụbu onyeisi ụlọọrụ 'Nigerian Security and Civil Defence Corps, (NSCDC)' na Niger state

Ebe foto si, NSCDC / Facebook

Nkọwa foto, Suberu Siyaka Aniviye
    • Onye dere ya, Michael Ilediagu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Ebeg o si, Lagos
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Gọọmenti Nigeria akwụsịtụla Suberu Siyaka Aniviye ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ 'Nigerian Security and Civil Defence Corps, (NSCDC)' na Niger state maka ọnwụ mmadụ iri atọ na asaa bụ ndị a na-enyo enyo na ha na-egwupụta ihe ọnatarachi n'ala n'ụzọ iwu akwadoghị na steeti ahụ.

Olubunmi Tunji-Ojo bụ minista na-ahụ maka ime mba Nigeria nyere iwu ahụ ka a kwụsịtụ Suberu Siyaka Aniviye ọrụ ma nye iwu ka e mee ezigbo nnyocha maka ọnwụ ndị ahụ nwụrụ.

Mmadụ iri atọ na asaa ndị ahụ nwụrụ bụ ndị NSCDC jidere n'ụbọchị Tuzde n'obodo a na-akpọ Borgu dị na Niger state na mpaghara ugwu Nigeria.

NSCDC jichiri ha n'ụlọ mkpọrọ nchere oge bụ ebe ha na-edosa ndị a na-enyo enyo mgbe ha nwụrụ.

Suberu Siyaka Aniviye bụbu onyeisi ụlọọrụ 'Nigerian Security and Civil Defence Corps, (NSCDC)' na Niger state

Ebe foto si, NSCDC / Facebook

Nkọwa foto, Suberu Siyaka Aniviye

Nkọwa ụlọọrụ NSCDC nyere maka ọnwụ mmadụ 37 n'aka ha

Ụlọọrụ 'Nigerian Security and Civil Defence Corps, (NSCDC)' enyela nkọwa maka ọnwụ mmadụ iri atọ na asaa nwụrụ n'ụlọọrụ ha na Niger state.

NSCDC nyere nkọwa ahụ n'ozi onye bụbu onyeisi ụlọọrụ ha na Niger state bụ Suberu Siyaka Aniviye binyere aka tupu gọọmenti etiti Naịjirịa akwụsịtụ ya ọrụ.

Isiokwu akwụkwọ ozi ahụ bụ "njide ndị a na-enyo enyo na-egwupụta ọnatarachi dị n'ala n'ụzọ iwu na-akwadoghị nakwa ọnwụ gburu ọtụtụ n'ime ha mgbe ọrịa gbasara n'ike n'ebe e jichiri ha".

NSCDC gara n'ihu kwu sị maka na "anyị dị njikere iwepụ ndị niile na-egwupụta ọnatarachi n'ala n'ụzọ iwu akwadoghi nke mere ka anyị jide igwe mmadụ bụ ndị a na-enyo enyo na-eme mpụ ahụ n'abalị iri na ise nakwa abalị iri na isii nke ọnwa Septemba 2026 ma napụta ha ọtụtụ ihe akaebe".

Ndị ọrụ NSCDC na Niger state

Ebe foto si, NSCDC / Facebook

"Mana ka o ruru n'abalị iri na asaa nke ọnwa Septemba 2026 ka a chọpụtara na ọtụtụ n'ime ha awụọla dị anyị na-enyo enyo na ọ bụ ọrịa tiwapụrụ n'ebe ha nọ butere ọnwụ ha".

"Ozu ndị nwụrụ n'ime ha ka e tinyegoro n'ọbaozu 'General Hospital, Minna, Niger state' dịka a na-eme nnyocha ịmara ihe gburu ha".

"Dịka NSCDC nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-etinye anya na mmiri banyere ihe mere, anyị na-arịọ ndị ohanaeze nakwa ezinaụlọ ndị ụmụ ha nwụrụ ka ha dere juu ma hara ime ihe ga-ebute ọgbaaghara nakwa ịda iwu obodo".