IPO: Kedụ ka ị ga-esi nweta oke onye nke gị nwụrụ anwụ?

Aha onyonyo, IPO: Kedụ ka ị ga-esi nweta oke onye nke gị nwụrụ anwụ?
IPO: Kedụ ka ị ga-esi nweta oke onye nke gị nwụrụ anwụ?
Mgbe e biputara ya

Ihe na-ewu ebe niile ugbua bụ IPO. Gị lee anya n'elu IPO, ilee anya n'ala IPO, aka nri na aka ekpe IPO IPO.

Ihe onye ọbụla na-eche bụ gbasara etu ha ga-esi rite uru ndị jupụtara n'ịzụrụ oke n'ụlọọrụ a ma ama.

Ee, ọ bụ ihe dị mma iche maka uru, mana ọ bụrụkwanụ na e nwee ka ọghọm siri dapụta n'ọdịnihu?

Ama m ihe i na-eche, ọ bụghị ya. Ihe m na-achọ ịkọwa bụ, ọ bụrụkwanụ ma a sị na mmadụ zụrụchaa oke ụlọọrụ ma nwụọ, o nwere ụzọ ụmụ ya maọbụ ikwu na ibe ya nwereike isi nweta oke ndị ahụ nakwa uru ndị sitere na ya?

Ọsịsa ya bụ ee, mana o nwere ụfọdụ ihe ị ga-eme ka o nweeike ruo gị aka.

Nke mbụ bụ ịchọpụta ụlọọrụ ha zụrụ oke ahụ nakwa ndị registrar ha si n'aka ha zụta ya.

Ngwangwa ị chọpụtara nke a, gaa kpọtụrụ ndị registrar ahụ, kọwaara ha na ndị nwe oke ahụ anwụọla, ma gwa ha na ọ ga-amasị gị ka e nyefee gị oke ndị ahụ nakwa uru ndị si na ha n'aka.

Ugbua, ọ dịzịịrị ụlọọrụ registrar ahụ ịgwa gị ihe niile ha chọrọ n'aka gị, nke nwereike ịgụnye asambodo ọnwụ, ya bụ iji kọwaa na onye ị na-achọ iweghara oke ya anwụọla n'eziokwu.

Ihe ndị ọzọ ha nwereike ịchọ n'aka gị bụ akwụkwọ si n'aka onye ọbụla onye ahụ nwụrụ anwụ nyere ikike ilekọta akụ ya ma ọ nwụọ.

Ọ bụrụ na i mechaa ihe ndị a, ị maara na i meela nke dị gị n'aka. Ugbua, ọ dịzịịrị ụlọọrụ registrar ahụ inyocha ozi niile i nyere ha, ma gbazie gị, iji mara etu ị ga-esi nweta oke nakwa uru onye nke gị hapụrụ n'ụwa laa mmụọ.