Nchọpụta anyị ebe ụlọelu dara n'Amaokpala dị nso n'Oko, Anambara steeti
Ndị gbanarịrị ọnwụ n'ụlọelu ogogo atọ dara n'Amaokpala dị nso n'Oko, Anambara steeti n'abalị Sọnde, Jụlaị 26, 2026 gwara BBC ihe ha ji anya ha hụ oge ihe ọdachi ahụ mere.
Dịka anyị ghọtara na ndị ihe ahụ metụtara na-agụ akwụkwọ maọbụ ndị gụchara akwụkwọ na Federal Polytechnic Oko; ndị anyị gbara ajụjụ ọnụ bi n'ụlọ ahụ gwara anyị etu o si bido.
Ndidi Omega bụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka gbatagbata n'Anambara steeti bụ State Emergency Management Agency, SEMA kọwara etu ọnọdụ si dị ma kwuo na ha zọpụtara mmadụ atọ n'abalị garaga ma mechaa wepụta ozu otu onye.
BBC ghọtara na a dịla na mbụ tinye akara ịkwatu ụlọahụ n'oge gara aga dịka Onyeisi SEMA si kwuo, mana ihe mere na a kwatubeghị ya ruo na ọ daa ma gbuo mmadụ bụ okwu na-arịọ ọsịsa ya.
E gwupụtala ozu otu nwaanyị n'ụvụrụ aja ụlọelu ahụ dara n'Oko Anambra Steeti dịka a ka na-achọ ndị ọzọ

Egwupụtala ozu otu nwaanyị n'ime ụvụrụ aja ụlọelu ogogo atọ ahụ dara n'Oko dị n'Anambra Steeti n'abali Sọnde 26 Julaị, 2026.
Dịka Ndidi Omega, odeakwụkwọ ụlọọrụ gbata gbata Anambra Steeti bụ SEMA si kwuo na otu nwaanyị nwụrụ bụ onye e gwupụtarala ozu ya na o nwekwara ozu otu nwokoroọbịa a hụrụ ka tọọrọ ebe ahụ.
O kwuru na ha na-agbasi mbọ ike ịhụ na a zọpụtara ndị ọzọ ka ọ n'ime ụlọ ahụ.
Ụlọelu ahụ a kpọrọ Elite Five Star Lodge dị n'akụkụ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala nke Tonimas dị n'Amokpala Oko bụ ebe ụfọdụ ụmụakwụkwọ bi nke mmadụ nkịtị nwee.

Mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo ruru ebe ahụ, o kwuru na nnukwu ihe mere n'ebe ahụ dịka akụkụ niile nke ụlọelu kụrụ afọ n'ala.
Ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị gbanahụrụ ọdachi ahụ kọọrọ ya ihe mere n'abalị ahụ.
"Ụlọelu a bụ ebe anyị bi dara n'ihe dịka elekere iri na otu nke abalị Sọnde dịka anyị na-akwado ihi ụra.
"Ụfọdụ n'ime anyị nụrụ ụda dịka ọ na-achọ ịda ma gbaa ọsọ gbapụta n'ezi ebe ụfọdụ ndị apụtaghị tupuu ọ daa.
"N'abalị ahụ e bupụtara mmadụ abụọ nke m ji anya m hụụ mana amaghị m ma ha dị ndụ ka ha ọ nwụọla.
"Ụfọdụ ndị ọzọ ka tọọrọ n'ime ụvụrụ aja n'ime ụlọ ahụ."
Akụkọ kwuru na ụlọ ahụ dara n'ihe dịka elekere iri na otu nke abalị Sọnde ma dagide ọtụtụ ụmụakwụkwọ bi na ya.

Ebe foto si, Anambra Current News
"Ndị ọrụ gbata gbata na-azọpụta ndị mmadụ ugbua"

Ebe foto si, Anambra Current News
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga sị na ndị ọrụ uweojii, ndị ọrụ mmenyụ ọkụ na ndị ọrụ gbata gbata jupụtara n'ebe ahụ iji zọpụta ndị ka tọọrọ n'ụvụrụ aja ụlọ ahụ.
O kwuru na a mabeghi kpọmkwem ọnụọgụgụ ndị ọdachi a metụtara kama na a zọpụtala ụfọdụ ndị merụrụ ahụ dịka a ka na-achọ ndị ọzọ achọ.




























