Ụfọdụ ụmụafọ Naịjirịa maọbụ ndị mgbọrọgwụ ha bụ Naịjirịa ga-eso n'asọmpi Iko Mba Ụwa 2026
Dịka anyị maara, Naịjirịa ga-anọ na-ele n'anya, n'ihi na otu egwu bọọlụ Super Eagles etozughị oke isonye n'asọmpi Iko Mba Ụwa nke afọ 2026. Mana, Naịjirịa ọ ga-agbaracha aka kpamkpam? Mba nụ.
O nwere ụfọdụ ụmụafọ Naịjirịa maọbụ ndị mgbọrọgwụ ha bụ Naịjirịa ga-eso n'asọmpi ahụ, mana ha ga-agbara mba ọzọ.
Otu n'ime ha bụ Bukayo Saka na-agbara Arsenal n'akụkụ, onye bụ nwaafọ Yoruba a mụrụ na Lọndọn, mana ọ ga-agbara otu egwu bọọlụ mba Ịngland.
Eberechi Eze na-agbara Arsenal n'etiti bụ nwaafọ Mbaise dị n'Imo steeti a mụrụ na Greenwich dị na Greater London, mana ọ ga-agbara otu egwu bọọlụ mba Ịngland.
Chukwunonso Azuka Madueke a maara nke ọma dịka Noni Madueke bụ nwaafọ Naịjirịa a mụrụ na Lọndọn. Ọ na-agbara Arsenal n'akụkụ, dịka ọ ga-agbakwara otu egwu bọọlụ Ịngland n'asọmpi Iko Mbaụwa.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Ndị ọzọ gụnyere:
Jamal Musiala na-agbara Bayern Munich n'etiti bụ nwaafọ Naịjirịa nne ya bụ onye Jamini, mana ọ ga-agbara otu egwu bọọla mba Jamini.
Felix Mmecha na-agbara Borussia Dortmund n'etiti bụ nwaafọ Naịjirịa, mana ọ ga-agbara otu egwu bọọlụ mba Jamini.
Manuel Akanji na-agbara Inter Milan dịka onye mkpachi etiti bụ nwaafọ Naịjirịa nne ya bụ onye Swizaland, mana ọ ga-agbara otu egwu bọolụ mba Swizaland.
Noah Okafor na-agbara Leeds United n'ihu bụ nwaafọ Igbo, mana ọ ga-agbara otu egwu bọọlụ Swizaland.
Tani Oluwaseyi na-agbara Villarreal n'ihu bụ nwaafọ Naịjirịa a mụrụ n'Abụja tupu ọ kwagaa Nọt Amerịka, mana ọ ga-agbara Kanada.
Promise David na-agbara Royal Union SG dịka onye na-asụnye goolu bụ nwaafọ Yoruba, mana ọ ga-agbara otu egwu bọọlụ mba Kanada.
David Alaba na-agbara Real Madrid n'etiti nakwa dịka onye mkpachi bụ nwaafọ Naịjirịa nne ya bụ onye Filipino, mana ọ ga-agbara otu egwu bọọlụ mba Ọstrịa.
Carney Chukwuemeka na-agbara Borussia Dortmund n'etiti bụ nwaafọ Naịjirịa, mana ọ ga-agbara otu egwu bọọlụ mba Ọstrịa.
Michael Olise na-agbara Bayern Munich n'akụkụ bụ nwaafọ Naịjirịa a mụrụ na Lọndọn, mana ọ ga-agbara otu egwu bọọlụ mba Fransị.
Kedụ ka ọgbabọọlụ nwereike isi tozuo oke ịgbara mba ọzọ bọọlụ?

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu bọọlụ ụkwụ, ọgbabọọlụ na-etozu oke ịgbara mba ọzọ site n'inweta ikike ịbụ nwaafọ nke mba ahụ maọbụ inwe mgbọrọgwụ na mba ahụ. Iwu FIFA kwuru na onye ọgbabọọlụ chọrọ ịgbanwe mba ha na-agbara bọọlụ ga-eburịrị ụzọ nweta nkwado, ma mezuokwa ihe ndị a:
* Igosi na a mụrụ ya onwe ya, nne maọbụ nna mụrụ ya maọbụ nnenne maọbụ nnanna ya na mba ahụ.
* Ọ bụrụ na o nweghị ihe dị etu ahụ, ọ ga-egosi na ya ebiela na mba ahụ ihe ruru afọ ise maọbụ karịa kemgbe o ruru afọ iri na asatọ.
* Ọgbabọọlụ agaghị enwe ike gbanwee mba ọ na-agbara bọọlụ ma ọ bụrụ na o nweela oge ọ gbarala mba ọzọ n'asọmpi ndị toro eto, dịka Iko Mbaụwa maọbụ ntozuoke mba dị iche iche.
* Ọgbabọọlụ na-akarịbeghị afọ iri abụọ na otu nwere ohere ịgbanwe mba ndị ọ na-agbara bọọlụ ma ọ bụrụ na ọ gbabeghị asọmpi ndị toro eto ugboro atọ, nke na-agụnyeghị Iko Mbaụwa maọbụ Iko mba dị iche iche, n'ime afọ atọ gara aga.






























