Ka ikpe Mmụọmmiriafuluanya, Eke-Hit, Onyeze Jesus na ndị ọzọ si gaa taa

Ụlọikpe Ukwu nke steeti Anambara steeti ehigharịala ikpe dịbịa a ma ama bụ Ikechukwu Ezenagu a ma dịka Mmuo Mmiri Afulu Anya gaa abalị atọ nke ọnwa Juun afọ 2026.
E higharịrị ikpe Ekene Igboekweze a ma dịka 'Eke-Hit' gaa abali asatọ nke ọnwa Mee afọ 2026, ebe Ikpe Onyebuchi Okocha a ma dịka 'Onyeeze Jesus' ga-adị n' abalị iri na asaa nke ọnwa.
A kpọtara Mmuommiriafuluanya n'ihu Ọkaikpe Jọstịs n'ụlọikpe ụbọchị Fraide ka ọ zaa ebubo e boro ya, mana ahu esịghị ya ike, dịka ọkaiwu ya bụ Kingsley Awuka.
Ọ sịrị,"Onye ọbụla lere ya anya ga-ahụ n'ezie na ahụ adịghị ya."
"O nweghị ike ịkwụ ọtọ ma ọ bụ ịga ije. E nyere ya aka bubata ya n'ime ebe ndị a na-ekpe ikpe na-eguzo."
Ọkaikpe Jọstịs ka ọ kwụrụ ọtọ ka a gụọrọ ya ebubo e boro ya, mana ahụ esighị ya ike ịkwụ ọtọ.
Ọkaikpe wee kwuo na ụdị ọnọdụ a adịghị mma mmadụ ịza ebubo e boro ya. Mmadụ kwesịrị ịza ebubo mgbe ahụ ike ya zuru oke.
Gọọmentị Anambara steeti kpụpụrụ Ezenagu na ndị ọzọ ụlọikpe maka ebubo metụtara ịgwọrọ ndị ekperema ọgwụ, ịgwọrọ ndị mmadụ okeite nakwa igwu ndị mmadụ chamdum.
E bu Mmuo Mmili Afulu Anya, ebu bata ụlọikpe

Díka Gọọmentí Anambara steeti kpụpụrụ Ikechukwu Ezenagu bụ dịbịa a ma ama n'ụlọikpe mbụ ya ụbọchị Wenezde, e si n'ụlọọgwụ ebe a sị ọ na-enwe nleta were bute ya n'ụlọikpe.
Nwaamadi ahụ e ji akwa na-acha ọcha n'elu traụza na-eji oji bụ onye e ji ụgbọala a si ụlọọgwụ kwọta ụlọikpe.
Ndị mmadụ nyere dọnyere nwaamadi ahụ ukwu ma dubata ya n'ụlọikpe bụ ebe onye

Eke-Hit, Onyeeze Jesus na ndị ọzọ awụchiela n'ụlọikpe

Ekene Igboekweze bụ dịbia a ma ama dịka 'Eke Hit', Onyebuchi Okocha a ma dịka 'Onyeeze Jesus' nakwa Igwe Lazarus awụchiela ụlọikpe Ukwu nke Anambara Steeti.
Gọọmentị Anambara steeti na-ekpe ha ikpe maka ebubo ọgwụ ego, ịgwọrọ ndị omekome ọgwụ, ịkpa nkata ntọrị ndị mmadụ nakwa igwu chandum.





























