Nwunye m na ụmụaka m bụ ngọzi Chineke nyere m - Williams Uchemba
Williams Uchemba bụ nwaafọ Imo state a ma ama na-eme ejije, ekwuola na nwunye ya na ụmụaka ya bụ nnukwu ngozi Chukwu ji jaa ndụ ya mma.
O kwuru nke oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka ma kọwaa na ọ bụ otu ihe na-enye ya obi aṅụrị kwa ụbọchị.
"Nwunye m na ụmụaka m bụ ngọzi Chineke nyere m. Chineke mekwara ebere nye m ezigbo nwaanyị. Ana m ekwu ya ebe niile na ebi m n'eluigwe maka nwaanyị m lụrụ nakwa ụmụaka ahụ siri ike, ma maa mma Chukwu nyere m. Ọ gbajuru dọrọ, oge ọbụla m nwere ụbọchị siri ike maọbụ nwee ndị na-achọ m okwu m chọrọ ịgbanarị, ọ bụ ha ka m na-agakwuru."
Ọ gara kọwaa etu ịhụnanya o nwere n'ezinaụlọ ya si mee ya ka ọ gaa Lonodo maka emume career day nwa ya nwaanyị.
"Nwa m nwere ihe a na-akpọ 'career day'. Agwara m onwe na agaghị ahapụ ịga ya. N'agbanyeghị na ọ bụ naanị nkeji iri abụọ ka e mere ya, abanyere m ụgbọelu gawa London iji sonye na ya maka nwa m nwaanyị. Ọ bụ eziokwu na ọ dị afọ anọ mana a maara na ọ ga-ahụ ya n'anya."
O kwuru na oge ọnọ na-agwa ụmụakwụkwọ ibe ya okwu, ọ hụrụ oké obi aṅụrị dị nwa ya n'anya. Ka e mesịrị ya, nwa ya jụrụ ya ka ọ aga alaghachitekwa ọzọ ma ha mee emume ahụ ọzọ.
Williams Uchemba kwuru na ya bụ onye Imo State mana ọ nọ dịka onye Enugu state.
"Abụ m onye Imo state mana anọ m ọnọdụ dịka onye Enugu state maka na a mụrụ m n'Enugu, agara ụlọakwụkwọ mahadum na Nsukka, njem m dịka onye na-eme ihe ejije bụ n'Enugu ka ọ bidoro. Ana m asụ asụsụ Enugu mana ana m asụkwa asụsụ obodo m. Abụ m onye Obazu Mbieri."
Ọ kọwara ihe mere e ji ahụ na gọọmenti ugbua.
"Ihe mere e ji na-ahụ m na gọọmenti bụ maka na n'afọ 2023, ahụrụ m onye ga-eme ihe m na-ekpe ekpere ịhụ n'onye ndu oge m na-eto dịka nwatakịrị. Chukwu mekwara ebere onye ahụ bụrụ onye mụ na ya bụ nwanne. Asịrị m na aga m akwado ya maka na amaara m na ọ ga-agbanwe ọtụtụ ihe n'obodo anyị. Abụ m onye ndụmọdụ pụrụiche Gọvanọ n'ihe gbasara mgbasaozi dijital.
O kwuru na nke a bụ maka na e nwere ndị na-atụ anya na ọ ga na-agwa ha ihe na-eme na gọọmenti maka na ọ gwara ha ka ha kwado onye ahụ.
"Ọ bụ ya mere m ji sị na aga m anọ ma hụ na m na-ewepụta ihe niile gọọmenti na-eme ka ndị mmadụ na-ahụ ya. Agaghị asị na m nwere regret. Ihe m ga-ekwu bụ na, ana m ekwu ya oge niile na ọ bụ na amataghị m Chineke n'oge. Ndụ m na-ebi ugbua bụ ndụ Chineke dere ede ma gwa m ka na-aga n'ime ya. Ọ bụ ya mere o ji bụrụ onye na-enye m ike ma na-echekwa m. Onye m tụkwasịrị obi m niile."



