A nwụchiela ụmụakwụkwọ asatọ a na-enyo na ọ bụ ha sunyere ọkụ gbagburu ụmụakwụkwọ 16 na Kenya

Ebe foto si, Screengrab
Ndịuweojii ejidela ụmụakwụkwọ asatọ a na-enyo enyo na ha nwere aka n'ọkụ gbagburu mmadụ iri na isi n'ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyị na mba Kenya.
Ọkụ ahụ tiwapụrụ n'ụtụtụ Tọzdee n'ụlọakwụkwọ 'Utumishi Girls Academy' dị na Gilgil, nso n'isiobodo Kenya bụ Nairobi, gbara gbamgbam nke ụlọobibi ụmụakwụkwọ ahụ nwere akwa ruru otu narị na iri atọ na ise (135).
N'ozi ha zipụrụ, Ndịuweojii kwuru na mgbe ha gbachara ụmụakwụkwọ na ndịọrụ ụlọakwụkwọ ahụ ajụjụọnụ, ma nyochakwaa onyonyo CCTV, ha chọpụtara ụmụakwụkwọ asatọ dịka ndị a na-enyo enyo na ha nwere aka na nhazi na mmụnye ọkụ ahụ.

Ebe foto si, Reuters
Ụmuakwụkwọ 16 anwụọla n'ọkụ gbara ụlọbibi ụmụakwụkwọ.
Ọdachi ahụ mere n'ụlọakwụkwọ 'Utumishi Girls Academy' nke dị nUgwu ndịda anyanwụ nso na Nairabi, isiobodo Kenya
Ọtụtụ ụmụakwụkwọ merụrụ ahụ, e buga ha ụlọọgwụ, a hapụrụ 71 ka ha lawa dịka ha natachara nleta, ebe asaa ka nọ n'ụlọọgwụ
Minịsta agụmakwụkwọ mba ahụ bụ Julius Ogamba kwuru na a mabeghị ihe butere ọkụ ahụ mana nnyocha na-aga n'ihu.
Ọ kụ malitere oge ụmụakwụkwọ ka nọ n'ụra n'ụzọ ụtụtụ Tọzde.






























