Gịnị bụ ọrịa Shamonda virus tiwapụrụ na mba France?

Njirimara ụlọọrụ WHO
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Mba France ewkupụtala na ha achọpụtala otu onye bu ọrịa Shamonda virus.

Shamonda virus a bụ ọrịa e kwuru na a na-ahụkarị n'ụmụanụmanụ dịka ewu, atụrụ, ehi nakwa ịyịnya.

Ozi Tedros Adhanom Ghebreyesus bụ onyeisi ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) wepụtara n'akara X ya n'ụbọchị Tọzde 22 Ọktoba 2026, kwuru na a chọpụtara onye bu ọrịa Shamonda virus ahụ na mpaghara ọrịa ahụ na-efesa n'anụmanụ na mba France.

Tedros Adhanom Ghebreyesus kwuru nao nye ahụ nwụrụ site n'ọrịa ahụ n'ihi na ọnọdụ ahụike ya enweghịike ịlụso ọrịa ahụ ọgụ.

Ka ọ dị ugbua, Ghebreyesus kwuru na ụlọọrụ World Health Organization na gọọmenti mba France na-eme nnyocha iji nweta ozi zuruoke banyere etu ọrịa ahụ si fesaa n'ahụ mmadụ, usoro ya nakwa etu a ga-esi gbochie ọrịa ahụ ifesa.