'Maazị Agụ bụ onyonyoo anyị ji akụziri ụmụaka omenala Igbo'

Aha onyonyo, Igbo cartoon: 'Anyị chọrọ ịkụziri ụmụaka omenala Igbo n'ụzọ dị ụtọ'
'Maazị Agụ bụ onyonyoo anyị ji akụziri ụmụaka omenala Igbo'
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Orji Nnachi
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Ndị na-emepụta onyonyoo ụmụaka n'asụsụ Igbo a maara dịka Mmụta Dị Ụtọ maọbụ Maazị Agụ ekwuola na ọ bụ mmasị ha nwere ịkụziri ụmụaka omenala Igbo kpaliri mmụọ ha.

Udochi Okeke na Onyeyirichukwu Oguneme bụ ndị na-emepụta onyonyoo ahụ kwupụtara nke a oge ha na BBC nwere mkparịtaụka pụrụiche.

Ha kọwara na onyonyoo Maazị Agụ na-enye aka ime ka ụmụaka mụta asụsụ na omenala ha ma matakwa ndị ha bụ, na ebe ha si.

Udochi Okeke sịrị: "'Cartoon' anyị na-emepụta n'asụsụ Igbo na-enyere ụmụaka aka ịmata omenala ha, ịmata ebe ha si, ebe nne na nna ha siri bịa na mba ofesi, marakwa na asụsụ ha amaka".

"Oge m bụ nwata, nne na nna m kpọlatara mụ na ụmụnne m na Nigeria. Anyị gara ụlọakwụkwọ sekọndịrị n'Abia state. Anọrọ m na Nigeria ihe dịka afọ atọ. Amụtara m omenala na asụsụ Igbo. Ọ bụ n'ihi etu mụ na ndị Igbo siri nọkọọ mgbe m nọ na Nigeria, nyere m mmasị ịmụta ihe karịrị ihe m hụrụ mgbe m nọ na mba ofesi."

N'aka nke ya, Onyeyirichukwu Oguneme kwuru na ụmụaka na-enwe ezigbo mmasị ikiri Maazị Agụ n'ihi na e mepụtara ya n'ụdị na-akpa ha obi ọma.

"Ana m ahụ ihe onyonyoo ebe nwatakịrị nụ ebe Maazị Agụ na-egbu ọja, ọ mabeghịkwa egwu nke na-ebido, ọ hapụ ihe ọbụla ọ na-eme gbara gaa n'ihu igwe onyonyoo ha."

"Ha kiriwe nke a. Nke a bụ nke anyị. Ihe mere anyị ji were Igbo na-emepụta 'cartoon' a bụ maka na anyị chọpụtara na ọ kachasị mfe iji ya kụziere ụmụaka ihe, karịa iji ihu anyị dịka ndị okenye".

"Maka na ụmụaka nwere ihe na-amasị ha. Anyị sị ka anyị were ihe ahụ na-amasị ụmụaka. Ihe ahụ ndị mba ofesi ji emekwa nke ha, ụmụaka ji esonyere ha nke ọma. Ka anyị werekwa otu ihe ahụ ji mepụta nke anyị," ka Oguneme kwuru.