Gịnị mere ndịagha jiri kwupụta nde naịra 30 n'isi Gentle D Yahoo?

Aha onyonyo, Gịnị mere ndịagha jiri kwupụta nde naịra 30 n'isi Gentle D Yahoo?
Gịnị mere ndịagha jiri kwupụta nde naịra 30 n'isi Gentle D Yahoo?
Mgbe e biputara ya

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala Ifeanyi Eze Okorienta a maara nke ọma dịka "Gentle D Yahoo" dịka onye a na-achọ achọ ma kwuo na ha ga-enye onye ọbụla ga-enyere ha inwuchi ya nde Naịra iri atọ.

Ndịagha Naịjirịa site n'otu ọrụ nchekwa 'Joint Task Force' a kpọrọ Udo Ka, kọwara Gentle D Yahoo dịka onye na-eyi ndụ egwu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ma gbaa ọha mmadụ ume ka ha wetere ha ozi ndị ga-enyere ha aka inwuchi ya.

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị 16 Ọktoba 2025 ka ọnụ na-ekwuru ndịagha n'oge ahụ bụ Major-General Markus Kangye kwupụtara na ha anwụchiela Gentle D Yahoo bụ Ọchịagha otu Eastern Security Network.

Tupu nke a, e fesaburu akụkọ ebe niile na ndịagha ememilaala Gentle D Yahoo na ndị otu ya, n'ihi ebubo ibute tigbuo zọgbuo na mpaghara Owere na Ọkigwe dị n'Imo Steeti.

Mana ka a banyere n'ọnwa Jenụwarị 2026, Gentle D Yahoo tipụtara n'ọgbe nzikọrịtaozi soshal midịa, wepụta onyonyoo o sere n'ime ọhịa, bụ nke o jiri kọchaa ndịagha Naịjirịa ma kwaa ndị ọrụ nchekwa emo.

N'ihe onyonyoo ahụ, Gentle D Yahoo kọwara na ya dara ọrịa, maka na ya na ụfọdụ ndị otu ya riri nsi nke fọdụrụ ntakịrị ka o gbuo ha, mana e buuru ha gaa na nke dibịa na Krọs Riva Steeti, ebe a nọọrọ gwọọ ha.

Oge ọ na-azaghachi nke a n'ọnwa Jenụwarị 2026, ọnụ na-ekwuru ndịagha bụ Mike Onoja kwuru na ndịagha ejibeghị anya ha hụ ihe onyonyoo ahụ Gentle D Yahoo wepụtara, ma kwee nkwa na ha ga-eme nnyocha gbasara ya.

Onoja kwukwara na onyonyoo ahụ nwereike ịbụ nke e ji akụrụngwa AI mepụta iji kụsasịa udo ma tinye ndị mmadụ n'ụjọ nakwa obi mmapụ.

Ugbua, dịka o rurula ihe dịka ọnwa iri na otu ndịagha kwuru na ha anwụchiela Gentle D Yahoo, ha ewepụtala ozi ọzọ iji kwupụta ya dịka onye a na-achọ achọ, ma kwuo na ha ga-enye onye ọbụla ga-enyere ha aka inwuchi ya ego dị nde Naịra iri atọ.

Ka ọ dị, ha dọrọ aka na ntị ka ọha mmadụ zere iji aka ha achụso nwaokoroọbịa ahụ, kama ka e ziteere ha ozi ọbụla bara uru ga-enyere ha aka inwuchi ya.