Eji m ịtụ crate ewepụ abụba n'ahụ m ka m ghara ibu ibu - Mmesoma Ezekiel (Crate girl)
Eji m ịtụ crate ewepụ abụba n'ahụ m ka m ghara ibu ibu - Mmesoma Ezekiel (Crate girl)
Mgbe e biputara ya
Nwada Mmesoma Ezekiel kwuru na o nwere mmasị ịtụ crate mmanya maka na ọ na-eji ya ewepụ abụba n'ahụ ya.
Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, Mmesoma kwuru na ọ rụọ ọrụ ịtụ crate a ihe ruru afọ iri.
O kwuru na ego ọ na-enwete na ya nyeere ya aka ịzụta umu ururu ihe ndị o ji agụ akwụkwọ maka na ọ bụghị onye na-arịọ arịrịọ ego.
O kwuru na ọ na-akwọ kwa ụgbọala iji ekesara ndị ahịa ha mmanya ma bulata crate mmanya.
O kwuru na-agbanyeghi na ọ bụ nwaanyị na ihe ndị ahụ anaghị egbochi ya maọbụ mee ya ihere n'ọrụ ọ na-arụ.
Kirie ihe ndị o kwuru n'uju.






