You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ịṅụ mmanya na ise anwụrụ anaghị ebunye uche ide egwu - Evado
Otiegwu Emmanuel Njoku Chidubem a maara dịka Evado agwala BBC News Igbo etu njem ya dịka otiegwu si malite.
Evado kwuru na ọ bụ onye Ebonyi Steeti mana a mụrụ ya n'Enugwu steeti. Ọ gara ụlọakwụkwọ Modern Praịmarị school dị n'Abakpa o si ebe ahụ gaa ụlọakwụkwọ National Grammar School a maara dịka Nike Boys.
Na mkparịtaụka anyị na ya nwere,o kọwara etu o si malite ịza 'Evado' nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ gụnyere nkwado nne na nna ya na-enye ya na njem egwu nakwa etu o si zute Phyno.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na ya anaghị eti egwu taa, na ọ bụ azụmahịa ka ọ gara ị na-eme maka na ọ hụrụ azụmahịa n'anya nke ukwuu.
Evado gara n'ihu kwuo okwu banyere mmanya ọkụ nakwa anwụrụ ndị na-etiegwu na-ese iji bute uche bekee kpọrọ 'inspiration' iji dee egwu.
N'okwu ya "Anwụrụ na mmanya anaghị enye inspiration ọbụla, ọ ga-eme gị ị ghara iche uche dị omimi, ọ bụ naanị elu egwu ka ị ga na-ede.
Evado kwuru na n'agbanyeghị na iti egwu adịghị mfe, o kwuru na nnukwu ego nakwa uru ndị ọzọ dị n'iti egwu.
Ọ gwara ndị ntorobịa chọrọ ịmalite iti egwu taa, ka ha jisie ike ma ghara ịda mba. Ọ gwara ha na-agba mbọ n'agbanyeghị ihe isi ike ọbụla ha zutere n'ụzọ. O mere ka o doo anya na o tee aka ọ dị njọ, ọ ga-adị mma.