Ịṅụ mmanya na ise anwụrụ anaghị ebunye uche ide egwu - Evado

Ịṅụ mmanya na ise anwụrụ anaghị ebunye uche ide egwu - Evado

Otiegwu Emmanuel Njoku Chidubem a maara dịka Evado agwala BBC News Igbo etu njem ya dịka otiegwu si malite.

Evado kwuru na ọ bụ onye Ebonyi Steeti mana a mụrụ ya n'Enugwu steeti. Ọ gara ụlọakwụkwọ Modern Praịmarị school dị n'Abakpa o si ebe ahụ gaa ụlọakwụkwọ National Grammar School a maara dịka Nike Boys.

Na mkparịtaụka anyị na ya nwere,o kọwara etu o si malite ịza 'Evado' nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ gụnyere nkwado nne na nna ya na-enye ya na njem egwu nakwa etu o si zute Phyno.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na ya anaghị eti egwu taa, na ọ bụ azụmahịa ka ọ gara ị na-eme maka na ọ hụrụ azụmahịa n'anya nke ukwuu.

Evado gara n'ihu kwuo okwu banyere mmanya ọkụ nakwa anwụrụ ndị na-etiegwu na-ese iji bute uche bekee kpọrọ 'inspiration' iji dee egwu.

N'okwu ya "Anwụrụ na mmanya anaghị enye inspiration ọbụla, ọ ga-eme gị ị ghara iche uche dị omimi, ọ bụ naanị elu egwu ka ị ga na-ede.

Evado kwuru na n'agbanyeghị na iti egwu adịghị mfe, o kwuru na nnukwu ego nakwa uru ndị ọzọ dị n'iti egwu.

Ọ gwara ndị ntorobịa chọrọ ịmalite iti egwu taa, ka ha jisie ike ma ghara ịda mba. Ọ gwara ha na-agba mbọ n'agbanyeghị ihe isi ike ọbụla ha zutere n'ụzọ. O mere ka o doo anya na o tee aka ọ dị njọ, ọ ga-adị mma.