You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ dị mkpa - Eprel 15, 2026
Akụkọ dị mkpa - Eprel 15, 2026
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Gọọmentị Etiti adọọla steeti iri atọ na atọ aka na andị sị na obodo puku iri na anọ ga-enwe nsogbu oke idemmiri n'afọ 2026.
- Minista na-ahụ maka mmiri na nkpocha na nzacha bụ Ọkammụta Joseph Utsev, bụ onye gbara ama rụtụrụ aka na okpuru Ọchịchị 226 dị steeti iri atịọ na atọ nakwa Abuja so n'ebe oke idemmiri ga-awakpo n'afọ a.
- Steeti oke idemmiri ga-emetụta gụnyere: Abia, Anambara ,Ebonyi, Enugwu, Imo, Edo, Delta, Bauchi, Bayelsa, Benue, Borno, Krọs Riva.
- Ndị ọzọ bụ Jigawa, Kaduna, Kano, Kebbi, Kogi, Kwara, Legos, Nasarawa, Naija, Ogun, Ondo, Osun, Oyo, Platu, Rivas, Sokoto, Taraba, Yobe, Zamfara, nakwa Abuja.
- Onyeisi Ụka Katolik bụ Pope Leo amalitere njem abalị atọ na mba Kemerun ụbọchị Wenezde.
- A na-atụ anya na Pope ga-agakwa mba Angola nakwa Equatorial Guinea dịka ő akpọ ndị ndu mba uwa oku ka ha gbaa mbọ gboo mkpa ndị Afrịka bụ ebe pasent iri abụọ ndị mmadụ na-ekpe ụka Katọlik.
- Maka akụkọ banyere nnukwu ọgbakọ ADC, pịa aka na BBCNewsIgbo.com.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.