You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Njem ndọrọndọrọ ọchịchị Atiku Abubakar
Atiku Abubakar ekwuola na ntuliaka 2027 ga-abụ oge ikpeazụ ọ ga-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.
Kemgbe o kwuru nke a, ọtụtụ mmadụ malitere ịjụ onwe ajụjụ banyere onye Atiku Abubakar bụ nakwa ugboro ole ọ zọgoro ọkwa Onyisiala Naịjirịa.
A mụrụ Atiku Abubakar n'abalị iri na ise nke ọnwa Nọvemba, 1946 n'obodo Jada dị n'Adamawa Steeti.
Ọ gara ụlọawkụkwọ Jada Praịmarị School, ma pụta n'ụlọakwụwkọ Provincial Sekọndrị, Jada n'Adamawa steeti n'afọ 1965.
Ọ gara ụlọakwụkwọ Nigeria Police College dị na Kaduna Steeti mana o hapụrụ ụlọakwụkwọ ahụ ma malite ịrụ ọrụ dịka onye ọrụ ụtụisi na n'ụlọọrụ Regional Ministrị of Finance tupu ọ gawa ụlọakwkwọ School of Hygiene dị na Kano Steeti.
Ọ wetara nzere Law Diploma n'olu bekee na mahadum Ahmadu Bello University Institue of Administration n'afọ 1969. Ụlọọrụ Nigeria Customs Service weere Atiku Abụbakar n'ọrụ dịka agha Nigeria Civil War malitere.
Ọ rụrụ ọrụ n'ụlọọrụ Nigeria Customs Service ruo afọ iri abụọ ma rigo n'ọkwa dịka osote onyeisi ụlọọrụ ahụ.
Oge mbụ Atiku Abubakar zọrọ ọkwa ọchịchị ọbụla bụ n'afọ 1990 oge ọ zọrọ ọkwa Gọvanọ Gongola Steeti mana tupu e mee ntliaka ahụ, gọọmenti etiti kewara Gongola ụzọ abụọ nke bụ Taraba na Adamawa steeti taa.
Nkewa a tinyere Atiku Abubakar n'Adamawa steeti. Ọ gara n'ihu zọọ ọkwa Gọvanọ Adamawa steeti na pati Social Democratic Party n'afọ 1991 mana gọọmenti machiri ya ịzọ ọkwa na ntuliaka ahụ.
Ngwa lee ugboro ole Atiku Abubakar zọrọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa. N'afọ 1993, Atiku Abubakar zọrọ ọkwa Onyeisiala na pati SDP mana MKO Abiola meriri ya ntuliaka ime ụlọ pati SDP.
Ka ntuliaka Juun 12, 1993 gara, Atiku Abubakar banyere pati United Nigeria Congress Party ma zọọ ọkwa Gọvanọ Adamawa Steeti n'oge ọchịchị Ọchịagha Sani Abacha mana ọnwụ Sani Abacha gbochiri nke a ịbịa na mmezu.
N'afọ 1998, Atiku Abubakar banyere Peoples Democratic Party ma zọọ ọkwa Gọvanọ Adamawa steeti ma merie na ntuliaka ahụ e mere na Disemba 1998.
Mana tupu e duo ya n'iyi ọrụ, ọ nabatara ịbụ osote Olusegun Obasanjo bụ onye ji aha PDP zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka e mere na 1999.
E duru Atiku Abubakar n'iyi ọrụ dịka osote onyeisiala Naịjirịa n'ọnwa Mee 29, 1999.
Atiku Abubakar zọrọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2007 na Pati ACN mana Umaru Yar'Adua nke pati PDP meriri ya na ntuliaka ahụ. Muhammadu Buhari gbara onye nke abụọ ebe Atiku Abubakar gbara onye nke atọ.
Atiku Abubakar laghachitere na PDP ma zọọ iji ọkọlọtọ PDP zọọ ọkwa Onyeisiala n'afọ 2011 mana Goodluck Jonathan meriri ya na ntuliaka ime ụlọ PDP.
N'afọ 2015, Atiku Abubakar zọrọ ọkwa Onyeisiala na pati All Progressives Congress (APC) mana Muhammadu Buhari meriri ya na ntuliaka ime ụlọ APC mere. Buhari gara n'ihu merie Goodluck Jonathan na ntuliaka ọkwa onyeisiala ahụ. E duru Buhari n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala na Mee 29, 2015.
Atiku Abubakar zọkwara ọkwa Onyeisiala ọzọ na Pati PDP n'afọ 2019 mana Muhammadu Buhari nke pati APC meriri ya na ntuliaka ahụ.
N'afọ 2023, Atiku Abubakar zọrọ ọkwa onyeisial na Pati PDP ma dakwaa ọzọ. Ọ bụ Bola Ahmed Tinubu nke pati APC meriri ntuliaka ahụ. E duru Bola Ahmed Tinubu n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala Naịjirịa n'ọnwa Mee 29, 2023.
Ka ọ dị ugbua, Atiku Abubakar ekwuola na ọ ga-azọkwa ọkwa Onyeisiala Naịjirịa ọzọ mana nke a ga-abụ nke ikpeazụ ya.
O kwuru na ọ bụrụ na pati African Democratic Congress ahọpụtaghị ya dịka onye ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa na ntuliaka afọ 2027, o mere ka o doo any ana ọ ga-akwado onye ọbụla pati ha họpụtara.