You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Oge na-adịghị anya, ntọhapụ Nnamdi Kanu ga-enwe isi - Obi Cubana
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Obinna Iyiegbu a maara nke ọma dịka Obi Cubana akọwaala na ya na-agba mbọ na nzuzo maka ntọhapụ oyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu.
Obi Cubana kpughere nke a oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche gbasara ọnọdụ ala Igbo nakwa ihe ndị a ga-eme iji wete mmepe doro anya na mpaghara ahụ.
Ọ sịrị: "Gbasara Nnamdi Kanu, ekwuola m maka ya sị na ọ bụ maka ọdịmma Naịjirịa, ọdịmma ala Igbo na e lebara okwu ya anya dịka e siri leba anya na nke ndị ọzọ, n'ihi na nke ya agaghị adị iche".
"Otu ụbọchị, ọ ga-enwe isi. Amaara m na oge na-adịghị anya, okwu a ga-enwe isi."
Obi Cubana mere ka o doo anya na ọ bụghị site na tigbuo zọgbuo ka nke a ga-eji bịa na mmezu, kama ọ bụ nke a pụrụ inweta site na mkparịtaụka.
Obi Cubana kọwara ihe jikọtara ya na Cubana Chief Priest, nwaafọ Imo Steeti a ma ama n'ihe gbasara ile ndị mmadụ ọbịa.
"Cubana Chief Priest bụ nwa m nwoke ma bụrụkwa nwanne m nwoke mụ na ya zụkọrọ ahịa. Ọ bụ ya lekọtara ụlọọrụ anyị dị n'Owere a na-akpọ Cubana Opium ruo ihe karịrị afọ isii, dịka onye na-agba odibo," ka Obi Cubana kọwara.
Obi Cubana kọwara ịgba odibo dịka ihe ndị Igbo jiri karịa ụwa niile ma bụrụkwa nke mere e ji nwee mmepe n'akụkụ mpaghara Igbo niile.
"Nke ahụ na-egosi "onye aghala nwanne ya". Gịnị ka ọ bụ? Onye hụ, ya kọọrọ ibe ya. Ọ bụ ihe dị etu a ka anyị na-eme, ị kpọrọ onye ahụ, zụọ ya. O ruzie oge ụnụ kpebiri, ọ bụrụ afọ ise, afọ isii, afọ asaa maọbụ afọ iri, i duo ya, kpeere ya ekpere ma gọọrọ ya ọfọ ọma".
"Ọ pụọkwa, ọ kpọrọ ụmụafọ Igbo ndị ọzọ, mepee nke ya. Tupu ị mara ihe na-eme, akpasaa akụ. Akụ ruo ụlọ, a mara onye kpara ya."
O kwuru na ọtụtụ ndị Igbo ji ego achụ nta ego anwaala iji nwayọ welata ụlọọrụ ha na mpaghara ala Igbo.
"Gị lee anya, ị ga-achọpụta na anyị onwe anyị ndị na-eji nwayọ ewelata ụlọọrụ anyị ụlọ, ọ na-agaziri anyị. Ngalaba ụlọọrụ anyị bụ Cubana dị n'Owere, Enugwu, Aba, ugbua, gị gbafee osimiri Naịja, ị ga-ahụ nke nnukwu anyị na-arụ ebe ahụ," ka ọ kọwara.
Maazị Obinna Iyiegbu bụ nwaafọ Ọba dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Idemili South n'Anambara Steeti.
Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị n'Ọba, gụọ nke sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ DMGS dị n'Ọnịcha ma gụọ mahadum na University of Nigeria dị na Nsụka, n'Enugwu Steeti.
O jiri otu afọ gaara ala nna ya ozi n'Ụlọomeiwu Naịjirịa n'afọ 1999. O kwuru na ya so na ndị mbụ fere ala nna ya oge ndịagha nyefere ọchịchị n'aka ndị nkịtị n'afọ 1999.
"Obi Cubana bụ aha ụlọọrụ m, ọ bụ aha e ji mara m ebe m na-achụ nta ego. Cubana bụ ụlọọrụ na-ahụ maka ileta ndị mmadụ anya site n'erimeri, aṅụmaṅụ na ile mmadụ ọbịa tupu ọrịa covid-19 etiwapụ, anyị amalite itinye aka n'ihe ndị ọzọ, dịka iwu ụlọ, imepụta ngwaahịa ndị a na-eri eri nakwa ndị a na-aṅụ aṅụ," ka ọ kọwara