Ego ole a na-ere 'nomination form' na Naịjirịa, Frans na mba ndị ọzọ

Ego ole a na-ere 'nomination form' na Naịjirịa, Frans na mba ndị ọzọ

Pati All Progressives Congress (APC) ekwuola ego ole ha ga-ere akwụkwọ igosi mmasị bekee kpọrọ Expression of Interest Form maka ịzọ ọkwa ọbụla na ntuliaka afọ 2027 gunyere ọkwa Onyeisiala, Gọvanọ, ọkwa ndị ụlọomeiwu steeti, Sineti nakwa ọkwa ndị ụlọnnọchiteanya etiti.

Otu narị nde naịra ( N100 million) bụ ego ole APC kwuru na ha ga-ere akwụkwọ igosi mmasị nakwa nnhọpụta onwe bekee kpọrọ expression of interest and nomination forms maka ọkwa Onyeisiala. Nke a bụ puku dọla iri asaa na anọ na narị abụọ na iri asaa na anọ ($74,274)

Onye chọrọ ịzọ Gọvanọ na pati APC ga-akwụ nde naịra iri ise (N50 million) iji tozuo isonye na ntuliaka ime ụlọ ha.

Maka ụlọomeiwu Sineti, ọnụego ya bụ nde naịra iri abụọ (N20 million) ebe ụlọnnọchiteanya etiti bụ nde naịra iri (N10 million).

Onye chọrọ ịzọ ọkwa ụlọomeiwu steeti na pati APC ga-akwụ nde naịra isi (N6 million)

Mana BBC Igbo mere nnyocha iji chọpụta ihe dị iche n'ego a na-ere akwụkwọ igosi mmasị ịzọ ọkwa na Naịjirịa nakwa mba Gana, Saụt Afrịka, Zimbabwe, Zambịa, Frans nakwa Amerịka.

Na France onye chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala anaghị akwụ ụgwọ ọbụla kama onye ahụ ga-enweta nkwado n'aka ndị ji ọkwa ọchịchị ruru narị ise.

Na Zimbawe, pati ZANU PF rere akwụkwọ igosi mmasị ha puku dọla iri abụọ ($20,000) n'afọ 2023.

Pati ANC mba Saụt Afrịka rere akwụkwọ igosi mmasị ha puku dọla iri na otu ($11,000) n'afọ 2024.

Na Zambịa, ọ bụ naanị puku dọla anọ ($4,000) ka onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2021 zụrụ akwụkwọ igosi mmasị ịzọ ọkwa.

Ego ole e rere akwụkwọ igosi mmasị ịzọ ọkwa Gọvanọ n'Amerịka n'afọ 2022 ruru puku dọla atọ na narị dọla asaa na iri ise ($3,750) mana ọnụego ego a dị iche na steeti dị iche iche.

Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Ghana rere akwụkwọ igosi mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala puku dọla itoolu na iri ise na asatọ ($9,058) n'afọ 2024.

APC kwuru na ha ga-amalite ire akwụkwọ ngosi mmasị ndị a n'ụbọchị Satọde abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Eprel ruo ụbọchị Satọde abalị abụọ nke ọnwa Mee, 2026.

Nnyocha ndị chọrọ ịzọ ọkwa Gọvanọ, ọkwa ụlọomeiwu steeti, Sineti nakwa ụlọnnọchiteanya n'APC ga-amalite n'ụbọchị Wenzede abalị isi ruo n'ụbọchị Fraịde abalị asatọ nke ọnwa Mee, 2026 ebe nnyọcha ndị chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala ga-abụ n'ụbọchị Satọde abalị itoolu nke ọnwa Mee, 2026.

APC kwuru na a ga-ewepụrụ ụmụnwaanyị nakwa ndị nwere nkwarụ chọrọ ịzọ ọkwa na pati APC ụfọdụ ego.

Mana anyị lere anya n'ego ole APC rere akwụkwọ igosi mmasị ịzọ ọkwa na ntuliaka afọ 2023 ma chọpụta na ọ APC tinyere nde naịra anọ n'ego e ji azụ akwụkwọ ahụ maka ọkwa ụlọomeiwu steeti ebe.

.

Ụmụnwaanyị nakwa ndị nwere nkwarụ zọrọ ọkwa na pati APC n'afọ 2023, bụ na akwụwkwọ igosi mmasị ka ha zụrụ ebe e nyere ha akwụkwọ nnhọpụta onwe bụ Nomiation form n'olu bekee n'efu.

APC ga-eme ntuliaka ime ụlọ maka ọkwa

Onyeisiala n'ụbọchị Fraịde abalị iri na ise ọnwa Mee,

Nke ọkwa Gọvanọ n'ụbọchị Satọde abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Mee,

Nke ụlọomeiwu Sineti n'ụbọchị Wenezde abalị iri abụọ nke ọnwa Mee, ebe

nke ụlọnnọchiteanya etiti ga-abụ n'ụbọchị Mọnde abalị iri na asatọ nke ọnwa Mee.

Ntuliaka imeụlọ maka ụlọomeiwu steeti ga-abụ n'ụbọchị Tọzde abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Mee ha niile na-eme n'afọ a bụ 2026

A na-atụ any ana pati ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ na Naịjirịa ga-ewepụta ego ole ha ga-ere akwụkwọ igosi mmasị nke ha ma mekwaa ntuliaka imeụlọ iji họpụta ndị ga-azọrọ ha ọkwa dị iche iche na ntuliaka afọ 2027.