Onye bụ Cole Tomas Allen chọrọ ịgbagbu Donald Trump?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

A ga-akpọga onye a na-enyo enyo na ọ gbara egbe n'ebe ndị ntaakụkọ White House na Onyeisiala na-erikọ nri abalị na Washington DC n'abalị Satọde n'ụlọikpe taa.

Ndị mgbasaozi mba Amerịka akọwaala ihe dị mkpa mmadụ kwesiri ịma banyere onye a na-enyo enyo gbara egbe oge Onyeisiala Trump na ndị nataakụkọ na-enwe ọgbakọ ahụ.

Lee ihe ịkwesiri ịma maka ya ebe a:

1. Aha onye a a na-enyo enyo bụ Cole Tomas Allen.

2. Ọ dị afọ iri atọ na otu. O si obodo Torransi na Kalifonịa dị na mba Amerịka.

3. Onyeisi ngalaba ikpe na mba Amerịka bụ Todd Blanche kwuru na nchọpụta "nke izizi" ha mere na-egosi na onye a a na-enyo enyo kwuru na ọ bụ ndị so n'ọchịchị Trump ka ọ chọrọ ịwakpo.

4. N'ihe na-erughị otu elekere nke ihe ahụ mere, n'ọba ozi ya n'akara soshịal midịa ya bụ Truth Social, ka Onyeisiala Trump kwupụtara na "e jidela onye ahụ gbara egbe ahụ", ma mesịa tinyekwa foto ya.

5. Ndị mmanye iwu gwara ndị ntaakụkọ BBC n'Amerịka na CBS News ụnyahụ na e ji onye a na-enyo enyo n'ụlọọrụ ndị uweojii Metropolitan dị na north-west Washington DC, na a ga-akpụga ya ụlọikpe na ụlọnga dị na ndịda-ọwụwa anyanwụ nke isi obodo ahụ.

Ihe BBC Verify chọpụtara maka nzọmụkwụ Allen n'ịntanet

BBC Verify bụ ngalaba BBC na-elebanye anya n'ịchọpụta ihe bụ eziokwu hụrụ ụfọdụ ihe maka Allen n'ịntanetị.

Ọtụtụ ihe ha chọpụtara gụnyere:

  • Ebe o debanyere aha ya n'akwụkwọ ntuliaka na-egosi na o debanyeghị aha n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla, n'agbanyeghị na ndekọ na-egosi na, o nyere ego ruru $25 (£ 18.50) n'ọnwa Ọktoba 2024, iji kwado Kamala Harris ịbụ Onyeisiala na ndọrọndọrọ ọchịchị.
  • Na LinkedIn, Allen na-akọwa onwe ya dịka onye aka ọrụ Injinia, onye nrụpụta egwuregwu na onye nkuzi, onye gụrụ akwụkwọ ịbụ Ịnjinia na California Institute of Technology (Caltech) ma sonyekwa na ndị otu Kraịst n'ụlọụka ya.
  • Na Disemba 2024, ụlọọrụ C2 Education nke na-akụziri ụmụakwụkwọ kọleji ihe iji jikere maka ule ha, wepụtara aha dịka onye nkụzi kachasị mee nke ọma n'ọnwa. Ọ gụchara kọmputa sayensị na 2025 na Mahadum California State University, Dominguez Hills.

Kedụ ihe ga-eme ugbua?

A na-atụ anya na a ga-akpọpụ Allen n'ụlọikpe taa maka mwakpo o mere n'ogige ebe e mere ọgbakọ nrị abalị ndị ntaakụkọ na Onyeisiala Trump na mba Amerịka.

Ebubo a ga-ebo ya, dịka onye ọrụ gọọmenti etiti bụ Blanche si kwuo "Mkpesa gọọmenti etiti ga-abịa ma emechaa".

Cheta na egbe a gbara n'oge nri abalị nke ndị ntaakụkọ White House na Onyeisiala Trump bụ ugboro nke atọ a na-agba Onyeisiala Donald Trump egbe, na-esochi ihe mere na Butler, Pennsylvania na Julaị 2024, na n'ụlọọgbakọ golf ya na Florida na Septemba afọ ahụ.

Mana n'ajụjụ ọnụ ya na nkeji 60 ụnyaahụ, Trump kwuru, sị: "Enweghị m nchegbu. Aghọtara m ndụ. Anyị bi n'ụwa na-emebi."

A jụrụ ya maka usoro ihe omume - nke mbụ si n'ime ụlọ kpọpụ JD Vance - Trump kwuru na ọ "adịghị eme ka ọ dịrị ya mfe" ndị ọrụ Secret Service chụpụ ya n'ime ụlọ.

"Achọrọ m ịhụ ihe na-eme ... Achọrọ m ịhụ ihe na-eme. Ma n'oge ahụ anyị malitere ịghọta, ma eleghị anya ọ bụ nsogbu ọjọọ."

A jụrụ ya maka "ịrịdata" ka a na-esi n'ime ụlọ duru ya, Trump zara, sị: "M malitere iso ha (ndị ọrụ nchekwa) na-eje ije. M tụgharịrị, amalitere m ije ije, ha wee sị, 'Biko gbadaa. Biko gbadaa n'ala.'

"Ya mere, m gbadara na nwunye eze gbadara."

Onye otu BBC ibe ya bụ CBS News ahụla akwụkwọ e dereede kwenyere na o jikọrọ ya na onye a na-enyo enyo, Cole Allen, na-ekwu na ọ chọrọ imetụta ndị otu ọchịchị Trump "site n'ọkwa kachasị elu ruo na nke kacha nta".