Oge onye ojiegbe wakporo ọgbakọ Onyeisiala Donald Trump na Washington

Oge onye ojiegbe wakporo ọgbakọ Onyeisiala Donald Trump na Washington

Ndị na-echekwa Onyeisiala Donald Trump mba Amerịka na nwunye ya Melania Trump kpọpụrụ ha n'ike iji zọọ ndụ ya oge a nụrụ ụda egbe na mmemme ọgbakọ ndị ntaakụkọ n'obi ọchịchị White House na Satọde abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Eprel 2026.

A kpọpụkwara osote Onyeisiala JD Vance n'ike dịka ọtụtụ ndị ọzọ bịara ọgbakọ ahụ zoro onwe ha n'okpuru oche.

E kwuru na nwaamadị gbara egbe ahụ bụ Cole Tomas Allen gbara afọ 31 si mpaghara Torrance dị na California.

Ndị uweojii kwuru na Allen nọ n'ụlọ oriri na nkwari Washington Hilton Hotel bụ ebe e mere mmemme ahụ ma kwuo na ha wetara ọtụtụ egbe na mma.

Ndị ọrụ nchekwa gara n'ihu gaa mee nnyocha n'ụlọ Allen dị na Torrance, California.

Oge a nwụchiri ya, Allen kwuru na ọ bụ ndị ọrụ Onyeisiala Trump ka ọ chọrọ ịwakpo.

E kwuru na mgbọ tụrụ otu onye ọrụ nchekwa oge ihe ahụ mere mana uwe na-egbochi mgbọ ya gbochiri mgbọ ahụ imerụ ya ahụ.

Ka ọ dị ugbua, a ga-akpụpụ Cole Tomas Allen n'ụlọikpe n'ụbọchị Mọnde.

Nke a abụghị oge mbụ onye ojiegbe na-awakpo Onyeisiala Trump.

Cheta na otu nwoke gbara Onyeisiala Trump egbe n'ọnwa Julaị 2024 na Pennsylvania oge ọ na-achụnta vootu maka ntuliaka ọkwa Onyeisiala e mere n'afọ ahụ.

Mana mgbọ egbe ahụ bụ ntị Trump ka o metụrụ.