Abakaliki Rice Mill: Ụmụnwaanyị mere ka osikapa Abakaliki bụrụ nke a ma ama

Aha onyonyo, Ụmụnwaanyị mere ka osikapa Abakaliki bụrụ nke a ma ama
Abakaliki Rice Mill: Ụmụnwaanyị mere ka osikapa Abakaliki bụrụ nke a ma ama
Mgbe e biputara ya

A maara Abakaliki Rice Mill dịka otu n'ime ogige na-emepụta osikapa na Nigeria mana ọtụtụ mmadụ amaghị na ụmụnwaanyị bụ na-arụ ebe ahụ. Ọrụ gbasara ịfụcha osikapa ahụ, itinye ya n'akpa, ire ya nakwa ihe ndị ọzọ, ọ bụ ụmụnwaanyị na-ahụ maka ya.

Anyị gara n'ogige Abakaliki Rice Mill dị n'Ebonyi state iji mara etu ụmụnwaanyị na-arụ ebe ahụ si arụpụta osikapa ahụ.

Otu nwaanyị anyị gbara ajụjụ ọnụ kọwaara anyị etu o si malite ịrụ ọrụ n'ogige ahụ ma kọwaa usoro dị iche iche e ji emepụta osikapa ahụ.

N'okwu ya, "Ebe anyị nọ taa bụ ebe a na-akpọ Abakaliki Rice Mill. Ebe a ka ị ga-ahụ na ụmụnwaanyị anaghị anọ na nkịtị. Anyị sịrị ka anyị hụ ka ha si emecha ya bụ osikapa ahụ. N'onwa iri na 2020 ka m batara ebe a. Abịara lee ya ma hụ etu ụmụnwaanyị ibe m si na-ebute ahịhịa a, ha bịara gwa m, m nwee malite isonyere ha.

"Esonyere m ha egbute ahịhịa ahụ na-awụsa ya ma si etu ahụ na-enweta nri mụ na ụmụaka m ga na-eri. Etu ahụ ka anyị si eme ya tupu onye abịa kpọọ m ka m zaara ya ụlọahịa ya. Ha sichaa osikapa, m chịpụ ute dị ebe ahụ ma zaa osikapa dị n'ala. Ọ bụ etu a ka m si na-eme ya tupu m malite ịzụta osikapa."

Ọ gara n'ihu kwuo na, "Ọ bụghị na ụmụnwoke anyị ndị Abakaliki anaghị eleta anyị anya ọfụma, o bụghị ya kama na ọ bụ maka na ihe a dị anyị n'agbụrụ. Onye ọbụla bụ onye Ebonyi na-eso nne na nna ya aga akọ ọrụ ugbo."

A kọpụta osikapa n'ugbo, ihe mbụ a na-eme ya bụ ibe ya, tie ya. Oge e tichara ya, a fọsịa ya ọfụma tupu e tinye ya n'akpa. I ga-eburu gaa n'ụlọ ma wụnye ya n'ime ite. Ọ bụrụ na i sie ya nke ọma, ọ bụ ya bụ osikapa ndị na-ama mma.

Mana ọ bụrụ na ị ka na-amụ etu e si esi ya, ọ bụ ya bụ osikapa ndị na anaghị ama mma. E nwekwara ụmụaka si ebe a gaa mba ofesi.

Ha kpọrọ m si ka ahọchaa osikapa a butere ha. Ha kwuru na etu osikapa Ebonyi Rice Mill si atọ dị iche n'etu osikapa ndị so atọ. Ọ mere ka a na-esi Lagos na Abuja abịa azụrụ osikapa ebe a. Ọ bụrụ na taa bụ ụbọchị ndị Lagos bịara ahịa, ị ga-ahụ ihe dị iche.