Aga m eji otu afọ gbanwee ọnọdụ nchekwa ọjọọ na Naịjirịa - Atiku Abubakar

Aha onyonyo, Aga m eji otu afọ gbanwee ọnọdụ nchekwa ọjọọ na Naịjirịa - Atiku Abubakar
Aga m eji otu afọ gbanwee ọnọdụ nchekwa ọjọọ na Naịjirịa - Atiku Abubakar
Mgbe e biputara ya

Atiku Abubakar bụbu Osote Onyeisiala Naịjirịa ma bụrụkwa onye ji otu patị African Democratic Congress (ADC) azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2027 ekwuola ọtụ ihe ọ ga-eme ma o merie na ntuliaka Onyeisiala a ga-eme n'afọ na-abịa abịa.

Atiku Abubakar kwuru ihe ndị ahụ n'oge ya na BBC News were mkparịtaụka pụrụiche. Atiku ji ohere ahụ zaa ajụjụ dị icheiche a jụrụ ya.

Mgbe a jụrụ ya maka ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere afọ ole ọ ga-adị ma ọ merie bụrụ onyeisiala dịka ọtụtụ na-ekwu na ọ ga-eru afọ iri asatọ, nke ga-eme na ọ gaghị enwe ike ịchịkwa ọchịchị nke ọma.

Mana Atiku zara sị " nke ahụ bụ ihe na-ezighị ezi n'ihi na anyị nwere onyeisiala dị afọ iri itoolu ugbu a, onye na-arịa ọrịa. Ahụụ dị m mma, ike dịkwa m. Gịnị mere na agaghị m eji onwe rụọrọ ndị mba m ọrụ?".

Mana ndekọ nke BBC ma na-ekwu na onyeisiala Naịjirịa erubeghị afọ iri itoolu, mana anyị enweghịkwa ike ịkwado ma ọ bụ gọnarị ihe ọ bụla gbasara afọ ole ọ dị.

Atiku gara n'ihu kwuo sị "enwere m ihe akaebe, ihe ndekọ na-egosi na ọ dị afọ ole ahụ. Aga m enwepụta ya n'ụlọikpe".

Ihe mere m ji chọọ iweghachite ego enyemaka mmanụ ụgbọala 'subsidy'

Atiku kọwara na ya na ndị ọkacha mara n'ọnọdụ akụnụba nwere mkparịtaụka banyere etu nwepụ e nwepụrụ ego enyemaka mmadụ ụgbọala 'subsidy' si emetụta ụmụ Naịjịrịa ma kwuo na nke ahụ mere ya ji chọọ iwepụ ya.

N'okwu ya "Agakwuru m ọtụtụ ndị ọkachamara n'ihe gbasara akụnụba, ha kwuru na nwepụ ego enyemaka ahụ, ego a na-enweta site na mwepụ ego enyemaka ahụ, abaghị uru nye ndị nkịtị na Naịjirịa. O tinyekwala ọtụtụ ndị Naịjirịa n'ọnọdụ ịda ogbenye".

Ọ gara n'ihu katọọ mwepụ ndị gọọmenti nọ n'ọchịchị ugbua nwepụrụ ego ahụ. N'okwu ya "anyị ahụbeghị mmetụta ọ bụla n'akụnaụba anyị".

"Taa, anyị dara ogbenye karịa ka anyị dịbu. N'eziokwu, ọ bụrụ na ị lelee ọkwa ịda ogbenye nke Naịjirịa, ọ ka njọ. Gọọmentị na-ekwu na o nwetara nnukwu ego".

Kedụ maka ọnọdụ nchekwa?

Atiku dịka ọ na-akọwa ihe ọ ga-eme ọnọdụ enweghị ezi nchekwa na Naịjirịa kwuru sị "Ekwere m na ọ bụ ejighị ọrụ kpọrọ ihe n'akụkụ nke gọọmentị n'ihi na ha elebaghị anya na mkpa nchekwa".

"Nke mbụ, ndịagha ezughị oke. Anyị enweghị mmadụ zuru oke n'ala a, ma ọ bụ ezigbo ngwa ọrụ".

"Mba anyị kwesịrị itinye ego n'ebe ndị uweojii na ndịagha nọ, iji hụ na anyị ga-ekwe onye ọ bụla nkwa udo".

"Ekwere m na n'ime otu afọ ha kwesịrị ịhụ nke ahụ, ma e kwere m, n'ime otu afọ anyị nwereike ijikwa nke a, nnupụisi na ọnọdụ nchekwa ọjọọ nke zuru ebe niile".

Ọ gịnị ka ị ga-eme na ị daa na ntuliaka afọ 2027?

Atiku gara n'ihu kwupụta ihe ọ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ da ana ntuliaka onyeisiala nke afọ 2027.

N'okwu ya "Agaghị m azọ ọkwa. Ekwuola m ya. Mana nke ahụ apụtaghị na agaghị m etinye aka na ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ".

"Enwere m ike inye ndụmọdụ n'ihi na erutela m afọ inye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eto eto ndụmọdụ, ọgbọ ndị na-abịa, na ndị ọzọ".