A ga-enye onye ọbụla gbara ama pasenti ise n'ihe ha chọtara- EFCC

Aha onyonyo, A ga-enye onye ọbụla gbara ama pasenti ise n'ihe ha chọtara- EFCC
A ga-enye onye ọbụla gbara ama pasenti ise n'ihe ha chọtara- EFCC
Mgbe e biputara ya

Onyeisi ụlọọrụ Economic and Financial Crime Commmission (EFCC) bụ Ola Olukoyede ekwuola na ha ga-enye onye ọbụla gbara ha ama nyereaka ịchọpụta ego maọbụ ihe gọọmenti ndị mmadụ zuru ma buga mba ofesi, ego itiaka n'obi ga-ebido na pasenti abụọ n'ọkara ruo pasenti ise nke ihe ụlọọrụ ahụ chọtara.

Olukoyede kwere ụmụ Naịjirịa nọ na mba ofesi nkwa ahụ 'oge ọ na-agwa ha okwu n'ọgbakọ iri anọ na atọ nke 'International Symposium on Economic Crime in Cambridge, United Kingdom'.

Gịnị bụ 'Whistleblowing'?

'Whistleblowing' bụ asụsụ bekee mana ihe ọ pụtara na nkọwa Igbo bụ ịgba ama nzuzo.

Ọ bụrụ na EFCC emezuo nkwa ha nke a pụtara na uru dị n'ịgba ama nzuzo; mana kedụ ka iwu Naịjirịa si ahụ ya.

Abuchi Ogbachalu bụ ọkaiwu a maama kọwara na Naịjirịa enwebeghị iwu maka ịgba ama nzuzo mana ọ bụ atụmatụ ụlọọrụ gọọmenti dị icheiche ji akwado ndị mmadụ ka ha pụta ma gbaa ama ihe ha ma.

Nchekwa aha na ndekọ onye ọgba ama:

Dịka usoro ịgba ama nzuzo si dị, Onyeisi ụlọọrụ EFCC kwuru na ha ga-echekwa aha onye ọbụla gbaara ha ama ma nyereaka ka ha chọta ihe Naịjirịa e zuru ezu.

Cheta na iwu Naịjirịa nwere ntaramaahụhụ dịrị onye na-ebo mmadụ ibe ya ebubo ụgha.

Chetakwa na ngala 125 nke Naịjirịa Criminal Code kwuru na ibo onye aka ya dị ọcha ebubo bụ ịda iwu nke ntaraama ahụhụ ya bụ nga afọ iri na anọ.