'Ị malite ịgba ọsọ, ha ga-agba gị egbe': N'ime mwakpo na-akawanye njọ na Naịjirịa

Nwaanyị yi uwe hijab ọcha, anya ya na-acha ọbara ọbara
Nkọwa foto, Fatima kwuru na e gburu di ya na ụmụnne na mwakpo ndị ojiegbe
    • Onye dere ya, Yemisi Adegoke
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News Africa
    • Ebeg o si, Zamfara and Oyo states
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

"Ị gbabanye n'ime ụlọ, ha ga-amụnye ụlọ ahụ ọkụ," ka Fatima kwuru, dịka ọ kọwara mwakpo e mere n'obodo ya dị na Zamfara steeti dị na mpaghara ugwu Naịjirịa. "Ị pụta n'iro malite ịgba ọsọ, ha ga-agba gị egbe.

Ndị ojiegbe ahụ wakporo n'ụtụtụ, kewaa onwe ha n'otu dị iche iche ma gbochie ndị obodo: otu otu n'ime ha nọ n'ọnụ ụzọ, otu nọ n'etiti ebe otu ọzọ nọ n'azụ.

"Ha malitere ịgba egbe agharaaghara," nwaanyị ahụ gbara afọ 55 gwara BBC News.

Ọ bụ otu n'ime ọtụtụ mwakpo kpara mkpamkpa n'obodo ndị okpukperechi alakụba bi nke mere ka ha malite ịtụ egwu na e nwereike ịtọrọ ha.

Fatima kọwara etu mwakpo ahụ si gaa: "I nwereike ịhụ ọgbaatumtum otu narị, otu n'ime ha ga-ebu mmadụ atọ."

E gburu ihe ruru mmadụ 70, gụnyere ụmụaka n'obodo Bia Buki n'ọnwa Juun, dịka Fatima si kwuo.

Ọ kọwara na ndị ojiegbe ahụ wakporo obodo ahụ dịka ha na-agba ọsọ ebe ụmụaka merụrụ ahụ dịka ha danyere n'ime onuno. Ndị nwụrụ gụnyere di ya na ụmụnne ya isii.

Ọ bụ otu n'ime ụmụafọ Naịjirịa dị 800,000 otu UN kwuru na ha gbara ọsọ n'ụlọ ha na mpaghara ugwu Naịjirịa. Otu ihe mere ọtụtụ jiri hapụ ụlọ ha bụ maka mwakpo ndị a.

Ụfọdụ mwakpo ndị a bụ otu na-eyi ọha egwu mere ya, mana ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ojiegbe na-eji ọgbaatumtum akpagharị n'obodo na-eme mwakpo ndị ahụ tupu ndị ọrụ nchekwa awuchie.

Ọtụtụ puku mmadụ esonyela ndị ọrụ nchekwa ime obodo iji buo agha megide mwakpo ndị a, otu onye gwara BBC na ndị ọrụ nchekwa ha egbuola ọtụtụ ndị ojiegbe a.

Mana ndị ojiegbe a na-aga n'ihu na-eme mwakpo nke mere ka ọ na-akawanye njọ.

Ọtụtụ ụmụnwaanyị yi uwe hijab dị iche iche tukwuru ala n'akụkụ osisi aja juru n'ala ya
Nkọwa foto, E nweghị nri oriri nakwa ebe a na-ehi ụra n'ogige ndị gbara ọsọ ndị a dị na Gusau bụ ebe Fatime bi ugbua.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Fatima kwuru na ya ndị obodo ndị ọzọ gbabanyere n'ime ọhịa oge ndị ojiegbe ahụ wakporo ụlọ ya iji zoo onwe ha: "Ime ọhịa bụ ebe anyị na-enwe nchekwa. Anyị na ụmụaka anyị gbara ọsọ, ọ bụrụ na ị hụghị nwa gị, ị ga-akpọrọ nwa onye agbataobi gị."

O kwuru na ọtụtụ mmadụ hiri ụra n'ime ọhịa tupu ha erute isiobodo steeti bụ Gusau bụ "ebe ha nwetara ntakịrị udo".

Fatima na ụmụaka ya dị afọ itoolu ruo afọ iri atọ asaa bi n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị na Gusau.

Ọtụtụ ụmụnwaanyị tukuwuru n'ala n'ogige ahụ dịka ụfọdụ n'ime ha yi uwe hijab dị cihe iche. Ihe karịrị otu puku gbara ọsọ n'ụlọ ha bi ebe a, ka o kwuru.

Ibi ebe a adịghị mfe maka na "enweghị ebe a na-ehi ụra". Nri dị ụkọ, enyemaka anaghị abịa oge niile.

Fatima kọwara na oge ụfọdụ ọ bụ ndị nwere obi ọmịko na-enye ha nri gụnyere osikapa na ihe ndị ọzọ.

Ha na-eziga ụmụaka ha ka ha ga kpaa nkụ ha ga-ere iji nweta ego zụta nri, mana ndị ojiegbe atọrla ụmụaka 22, ka o kwuru.

"Oge anyị nwere udo, anyị nwere ego nke anyị, mana ugbua, ihe niile agbanweela, anyị abụrụla ndị na-arịọ arịrịọ."

Anya mmiri juru ya anya, o bere akwa ntakịrị nkeji, ma jiri aka ya hichaa anya ya.

O kwuru na oge mbụ ọ bịara n'ogige a, ụda egbe na-eme ka ọ ghara ihi ụra n'abalị. Mana ihe niile agbanweela ugbua maka na ndịagha nakwa ndị nchekwa ime obodo na-akpagharị ebe ahụ kwa mgbe.

Ụgbọala ndịagha bu ndịagha abụọ ji egbe n'azụ ya.
Nkọwa foto, Ndịagha na ndị ọrụ nchekwa na-agaghrị n'ụzọ Gusau iji chekwaa ndị na-eme njem n'aka ndị ojiegbe

Ndị ojiegbe ahụ bụ ndị si agbụrụ Fulani ndị ọ bụ ịchị ehi na anụmanụ ndị ọzọ ka si enweta ihe ha na-eri.

Ụfọdụ n'ime ha ahapụla ịchị ehi ma malite ịtọrọ ndị mmadụ iji nweta ego mgbapụta nke ha kwuru na ọ bụ ụzọ iji nweta ego nwgangwa.

Ha na-awakpo ọtụtụ obodo nakwa ndị na-eme njem, tọrọ ndị mmadụ iji nweta ego ntọhapụ a kpọrọ 'ransom' n'olu bekee, zuru ihe ọbụla ha hụrụ ma gbuo ụfọdụ ndị ha hcọrọ ịtọrọ lụsoro ha ọgụ.

Mwakpo ndị a abụrụla ihe na-eme kwa mgbe kwa mgbe. Na mpaghara ugwu Naịjirịa, ụlọọrụ mba ofesi Acled na-enyocha mwakpo ndị a, kwuru na mwakpo ndị a arịala ihe ruru pasenti 78 n'ụkara mbụ afọ 2026 nke dị iche iche n'etu ọ dị n'afọ ndị ọzọ gara aga.

Otu ụlọọrụ ọrụ nchekwa doro anya kwuru na ndị ojiegbe naara ego ntọhapụ ransom ruru nde $5.8m (£4.3m) n'ime afọ gara aga dịka ọnụọgụgụ ndị a tọrọ na-arị. Ụlọọrụ SBM na-eme nnyocha kwuru na a tọọrọ ihe ruru mmadụ 7,825 n'ime ọnwa Julaị 2025 na Juun 2026, nke ji pasenti 66 rịa n'afọ a karịa afọ gara aga.

Ọrịrị na mwakpo ndị ojiegbe a bụ ihe e kwuru mere o ji bụrụ okwu a kpụ n'ọnụ.

Malik Samuel na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ Good Governance Africa, na-eme nnyocha, kwuru na "a na-ahụta mwakpo ndị a na mpaghara niile dị iche iche".

Ọtụtụ ndị o doro anya kwuru na mwakpo ndị ojiegbe a emetụtala ọtụtụ obodo dị iche iche.

Ihu ụlọakwụkwọ ahụ, e mechiri ọnụ ụzọ ya. Ihe ụmụaka sere n'ahụ aja nke gụnyere ụfọdụ ụmụ anụmanụ.
Nkọwa foto, E mechiri ụlọakwụkwọ a wakporo n'Oyo steeti n'ọnwa Mee kemgbe mwakpo ahụ mere

Ụlọakwụkwọ bụ ebe ndị ojiegbe a na-awakpokarị.

Oge otu na-eyi ọha egwu Boko Haram tọọrọ ụmụakwụkwọ karịrị 200 n'obodo Chibok n'afọ 2014, akụkọ ahụ fesara ebe niile.

Ọtụtụ otu na-eyi ọha egwu na-eji ịtọrọ ndị mmadụ enweta ego dịka ọ bụ ụlọakwụkwọ, ụlọụka, ụlọ okpukperechi alakụba nakwa ime obodo ka ha na-awakpokarị.

N'ọnwa Mee 2026, ndị ojiegbe bu ọgbaatumtum wakporo ụlọakwụkwọ atọ n'Oyo steeti dị na ndịda ọdịda anyanwụ ebe e kwuru na e nwere ezi udo.

A tọọrọ ụmụaka dị 39 na ndị nkụzi asaa. E gburu otu onye nkụzi na mwakpo ahụ. E gosiri ihe onyonyo ebe e gburu otu onye ọzọ na soshal midia.

Ka abalị iri ise na isii gara, a tọhapụrụ mmadụ iri anọ na anọ. Gọọmenti kwuru na ha agaghị akwụ ego ntọhapụ ma kwuo na ndị ọrụ nchkewa gbara mbọ gbapụta ụmụakwụkwọ ahụ.

Ime otu ụlọakwụkwọ a gbara ọsọ na ya, ụfọdụ akwụkwọ tụgbọrọ n'ala ya ebe akpa akwụkwọ gbasara n'ala
Nkọwa foto, Ntọrị n'oyo steeti, emeela ka ọtụtụ nne na nna malite ịtụ egwu iziga ụmụaka ha ụlọakwụkwọ

Ntọrị ahụ tinyere egwu n'ahụ onye ọbụla nụrụ ya n'obodo Oriire nke mere ka ndị nne na nna kwụsị ụmụaka ha ịga ụlọakwụkwọ.

"Oke egwu dị n'obodo mere ka ọtụtụ gbaa ọsọ ndụ." ka Eze ọdịnala ebe ahụ bụ Oba Tajudeen Abioye kwuru onye a tọọrọ otu nwanne ya.

"Anyị na-tụanya na ndị ọrụ nchekwa ga-echekwa ndị fọdụrụ afọdụ", ka o kwuru.

Ọnụọgụgụ ụmụaka na-anaghị aga ụlọakwụkwọ na Naịjirịa so na nke kachasị n'ụwa niile: ụlọọrụ United Nations Educational, Scientific and Cultural Organization (Unesco) kwuru na ọnụọgụgụ ndị a ruru nde iri na itoolu 19m.

Ọtụtụ mwakpo ndị a pụtara na ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa nwere nnukwu ọrụ nke mere ka ha ghara inwe ike igbochi ụfọdụ mwakpo ndị a.

UN wepụtara akwụkwọ ozi n'afọ 2025 ma kwuo na ụlọọrụ ndị uweojii na Naịjirịa anaghị enweta nkwado zuruoke ma kwuo na ndị uweojii Naịjirịa enweghị ọzụzụ zuruoke.

Ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu mapụtara ego kachasị na bọjeti Naịjirịa maka nchekwa kemgbe a maara Naịjirịa n'afọ 2025. Ego ahụ ji pasenti 10 rịa. O nyekwara iwu ka e nwee ndịagha ọhụrụ 28,000 ọrụ.

Ndị ọrụ nchekwa ime obodo gọọmenti na-akwado ka e ji akwado agha ndịagha na-ebu megide ndị ojiegbe a.
Nkọwa foto, Ndị ọrụ nchekwa ime obodo gọọmenti na-akwado ka e ji akwado agha ndịagha na-ebu megide ndị ojiegbe a.

Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ obodo na-ata ahụhụ ebe ọtụtụ ndị Zamfara steeti abanyela ndị ọrụ nchekwa ime obodo iji hụ na e nwere nchekwa.

Ụfọdụ na-ekwu na nke bụ ihe nwereike ibute nsogbu n'ọdị n'ihu ma kpọọ oku ka gọọmenti tinye uche na ya.

N'agbanyeghị na ndị ọchịchị kwuru na ndị ọrụ nchekwa ime obodo ndị a nwetara ezi ọzụzụ, Samuel, si ụlọọrụ Good Governance Africa, kọwara ha dịka "ogbunigwe ga-etiwapụ n'oge adịghị anya".

Ọ kpọrọ oku ka Gọvanọ steeti nke ọ na-akwado, wee ya ma nye ọtụtụ mmadụ ọrụ ma nye ha ngwaagha iji buo agha megide ndị ojiegbe a. "Ndị ojiegbe a agaghị atụ gị egwu ma ọ bụrụ na i jighị akụrụngwa agha zuruokeu ebuso ha agha.

Maapụ Naịjirịa na-egosi Gusau dị na Zamfara steeti dị na mpaghara ugwu Naịjirịa nakwa Oriire Oyo steeti dị na mpaghara ndịda ọdịda anyanwụ
Naịjirịa. Isiobodo Naịjirịa bụ Abuja dị n'etiti

Fatima na-akpọ oku maka enyemaka: :Ndị ojiegbe a nọ ebe niile:.

"Anaghị m ekwu na gọọmenti anaghị agba mbọ, mana ha kwesịrị imekwu ọtụtụ ihe banyere nke a. Anyị kwenyere na e nwee ọtụtụ ndịagha na ndị ọrụ nchekwa, obodo anyị ga-enwe udo.

Ọ chọrọ ịlaghachi n'ụlọ ya, mana o kwuru na ọ maghị na nke a enwereike ime n'ihi na ọ nụrụ na ndị ojiegbe ahụ wakporo ha ejirila obodo ha mere ogige ha.

Ndị bi n'obodo ọzọ dị obodo ha nso, gbara ọsọ, "enweghị ihe ọbụla dị ndụ bi ebe ahụ ugbua, e nwere ọtụtụ obodo dị etu a," ka Fatima kwuru.

"Ọ bụrụ na ị laghachi na be anyị, nri adịghị... ọ bụrụ na ị gaa n'ugbo gị, ha ga-awakpo ma tọrọ gị."