Etu e si chọpụta ma kwatuo ụlọ ebe ndị ntọ zoro Dọkịta Emegakor
Ndị uweojii n'Anambara steeti kọwara etu ha si chọpụta ma kwatuo ụlọ ebe ndị ntọ zoro Dokita Edwin Emegakor onye nwe ụlọọgwụ "Crown Multi specialist Hospital" dị na Nkpor.
Komishona ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Ikioye Orutugu gwara ndị ntaakụkọ sị na n'abalị iri nke ọnwa Mee, ka ha na-achọ ụgbọala RX 350 lexus e zuru ezu; ha banyere n'ụlọ otu nwoke a maama dịka Fabulous.
Ha kwuru na Fabulous bụ onye a na-enyonyo maka aka ntụtụ ma bụrụkwa onye na-azụ ahia mgbuka.
Orutugu kwuru na Fabulous na ndị otu ya bidoro gbawa ndị uweojii egbe ma gbagbuo otu onye Uweojii.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị Uweojii n'onwe ha gbagbukwara mmadụ abụọ bụ ndị otu Fabulous.
N'ikpeazụ ka ha tọhapụrụ mmadụ anọ a tọọrọ nke otu onye n'ime ha bụ Dokita Edwin Emegakor onye nwe Crown Multi specialist Hospital, Nkpor.
Ọ sị na ndị uweojii buchitara ọtụtụ ụgbọala e zuru ezu, ego nakwa egbe ma mgbọ egbe di iche iche.
Ọ kwukwara na Mazi Fabulous bụ onye nwe ụlọ ahụ nọ n'aka ndị Uweojii ugbua.
Ka ọ dị ugbua gọmenti Anambra steeti ewerela Ugbọala "Buldozer" kwatuo ụlọ ahụ dịka iwu steeti si kwuo.

Ebe foto si, Crown Hospital/Facebook
Mkpu ọṅụ na-ada n'Anambra steeti ugbua dịka ngalaba ndị uweojii na-ebu agha megide ndị ojiegbe ezu ohi bụ Special Anti-Robbery Squad (Sars) anapụtala otu dọkịta n'aka ndị ntọrị.
Dọkịta Edwin Emegakor bụ onyeisi ụlọọgwụ Crown Multi-Specialist Hospital dị na Nkpọr, n'okpuru ọchịchị Idemmili North n'Anambra steeti, ka e kwuru nọ n'aka ndị omekome ahụ kemgbe izu ụka gara aga.
Akụkọ kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Tọzde abalị asaa nke ọnwa Mee ka ndị ntọrị wakporo ụlọọgwụ ya n'elekere isii nke mgbede, ma tọrọ ya bụ dọkịta.

Ebe foto si, Crown hospital/Facebook
Mgbe a na-achọ ndị tọọrọ dọkịta ahụ, otu jikọtara ndị dọkịta ahụike n'Anambra steeti bụ Nigerian Medical Association (NMA) mara ọkwa n'ụbọchị Satọde abalị itoolu nke ọnwa Mee ma kwuo na ha ga-amalite abụbọọrụ ma ọ bụrụ na ndị uweojii achọtaghị dọkịta ahụ na-efu efu.
Nke a mere ndị ụweojii tọọrọ ntị n'ala wee chọpụta na ọ bụ n'otu ụlọ 'duplex' dị n'Obosi Anambra steeti ka ndị ntọrị ahụ dobere ya.
Gịnị ka ndị uweojii kwuru?
Ndị uweojii zọpụtara dọkịta ahụ na mmadụ atọ ndị ọzọ eji eji n'ụbọchị Sọnde 10 Mee 2026.
E kwuru na dọkịta Emegakor enwerela onwe ya.
Dika ihe onyonyoo n'efegharị na soshal midịa siri gosi, ndị ntoroọbịa obodo ahụ agbaala ụlọ ahụ ndị ntọrị ji akpa ike ọkụ.
Onyeisi ndị otu NMA n'Anambra bụ Dọkịta Princewill Okam kwuru na ha agaghị agba abụbụọrụ kama ha kelere ndị ọrụ nchekwa ka ha siri mee ngwa ngwa ma zọpụta dọkịta Edwin Emegakor.






























