El-Nino: Etu ihe ndapụta ihu igwe ga-esi emetụta ndị Nigeria na ihe i kwesịrị ime iji chekwa onwe gị

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Etu El Niño nwere ike isi metụta gi na na ihe ndị ọzọ ịkwesịrị ịmata maka ya

Ụlọọrụ Nigeria na-ahụ maka ọnọdụ ihu eluigwe bụ 'Nigerian Meteorological Agency' (NiMet), adọọla aka na ntị na El Niño nwere ike ịgbanwe usoro mmiri ozuzo na okpomọkụ n'akụkụ dị iche iche Nigeria, nke nwere ike imetụta ọrụ ugbo, mmiri na ọkụ eletrik.