You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị ọkachamara sayensị na mba UK amalitela ịrụpụta ọgwụ mgbochi maka Ebola
Ndị ọkachamara na mahadum Oxford University na-emepụta ọgwụ mgbochi ọhụrụ nke e nwereike ịnwale n'ime ọnwa abụọ maọbụ atọ na-abịa abịa, iji nye aka n'agha a na-ebu megide ọrịa Ebola.
Ntiwapụ nke ugbua a hụtara na mba Democratic Republic of Congo egbuola mmadụ otu narị na iri asaa na asaa n'ime mmadụ narị asaa na iri ise a na-enyo enyo butere ya.
Ọdịdị Ebola a naghị eji ike ahụ, a kpọrọ Bundibugyo, bụ nke na-enwebeghị ọgwụ mgbochi, na-egbu ihe ruru ọkara atọ n'ime mmadụ ndị butere ya.
E nyeghị obisiike ma ọgwụ mgbochi ahụ ọ ga-arụ ọrụ, kama ọ ga-ewe naanị nchọcha e ji ụmụ amụmanụ mee nakwa ịnwale ya n'ahụ mmadụ, iji mara ma ọ ga-arụ ọrụ.
Mana ndị ọkachamara sayensị na-ekwu na ha na-agbasi mbọ ike, iji hụ na e nwetara ọgwụ mgbochi ahụ ma ọ bụrụ na a chọọ ya n'oge gbatagbata.
End of Akụkọ gbasara ọrịa nje Ebola ndị ọzọ ga-amasị gị
Ntịwapụ Ebola: Mmadụ isii e dobere iche n'ụlọọgwụ na DR Kongo n'ihi ọrịa a agbapụla
Gidigidi adaala n'ụlọọgwụ na mba DR Kongo dịka ndị ezianụlọ otu onye nwụrụ n'ọrịa Ebola bịara iburu ozu nwanne ha n'ike, ụbọchị Tọzde, dịka ndịọrụ ahụike mba ahụ si kwuo.
Dịka ya bụ ọgbaghara na-ada, mmadụ isi a na-enyo na ha bụ ọrịa ebola gụnyere mmadụ abụọ nnyocha gosiri na ha bu ya bụ ọrịa kpọmkwem gbapụrụ.
Nchọpụta BBC gosiri na e sunyere akụkụ ngalaba Ebola n'ụlọọgwụ 'Rwampara General Hospital ' ebe ya bụ ọgbaghara dara.
O doghị anya ma o nwere onye merụrụ ahụ mana ndịagha nyere ụfọdụ ndị ọrụahụike ebbe ahụ nchekwa ,ebe ndị uweojii gbaliri ime ka udo lọghachi n'ebe ahụ.
Ọrịa Ebola na-efesa site na ịmetụta mmiri maọbụ ọbara si n'ahụ onye bu ya ma na akacha njọ n'ozu onye o gburu, dịka ndị ahụike si kwuo.
WHO nwere usoro ha tụputara nke naanị ndị e nyere ọzụzụ ya yi akwa mgbochi na-eli onye ọrịa ebola gburu.
Kemgbe ọrịa tịwapụtara na DR Kongo, o gbula ihe karịị mmadụ 131, ebe mmadụ 600 bụ ndị a na-enyo na ha bu ya.
Ihe mere ọgwụ mgbochi Ebola nwere ike iru ọnwa itoolu tupu a rụpụta ya
Otu ahụike mbaụwa bụ 'World Health Organisation' (WHO) ekwuola na o nwere ike iwe ọnwa isii ruo itoolu tupu e mepụta ọgwụ mgbochi nje Ebola nke ụdị a na-akpọ Bundibugyo na-akpa ike ugbua na mba DR Kongo na ebe ndị ọzọ.
Onyeisi WHO, Tedros Adhanom Ghebreyesus, kwuru na a na-enyo ihe karịrị mmadụ narị isii enyo na ha bu ọrịa Ebola, ebe mmadụ otu narị na iri atọ na itoolu anwụọla.
O kwuru na ọnụọgụgụ a nwere ike ịkarị n'ihi na ịchọpụta ọrịa a na-ewe ogologo oge.
Ọkachamara WHO n'ihe gbasara ọgwụ mgbochi bụ Vasee Moorthy kwuru na e nwere ọgwụ mgbochi abụọ a na-arụpụta ugbu a maka ụdị Bundibugyo, mana ọ nweghị nke gosiri na ọ na-agwọ nje ahụ n'ahụ mmadụ.
O kwuru na ọgwụ mgbochi nke mbụ a na-anwale bụ nke yiri ọgwụ mgbochi Ebola dịbu adị. Ọgwụ nke a nwere nkwado a na-eji agwọ ụdị ọrịa Ebola kacha gbaa gburugburu.
O kọwara na ọgwụ mgbochi a bu nke kacha nwee olileanya maka ịgwọ ụdị Bundibugyo. Ma, ọ gbakwụnyere na ọgwu a agaghị adị njikere maka nkesa tupu ọnwa isii ma ọ bụ itoolu gaa n'ihu.
Ọgwụ mgbochi nke abụọ a na-eleba anya na ya bụ nke e mere n'ụdị ọgwụ AstraZeneca ahụ e ji lụso COVID-19 ọgụ.
Nyocha ya ka nọ na mbido, ma Moorthy kwuru na ọ nweghị ozi ọbụla doro anya na-egosi na ọ ga-arụ ọrụ nke ọma.
Bundibugyo bụ ụdị nje Ebola kacha dị ụkọ, nke a na-ahụbeghị kemgbe ihe karịrị afọ iri. Ụdị a enweghị ọgwụ mgbochi ọ bụla a kwadoro ma ọ bụ ọgwụgwọ pụrụ iche.
A na-ebute nje Ebola site na mmiri si n'ahụ mmadụ dị ka ọbara, maọbụ site n'ebe akpụkpọ ahụ mepere emepe. Nje a na-ebute ọrịa siri ike nke gụnyere ịgba ọbara n'ime ahụ.
A chọpụtara Ebola n'afọ 1976 na mba DR Congo. Akụkọ sị na nje a sitere na anụmanụ dị ka ụsụ.
Amerịka amachiela njem dịka nwaafọ ha butere Ebola
Mba Amerika adọọla ụmụamaala ya aka na ntị ka ha zere ime njem gaa obodo atọ dị n'Afrika n'ihi ntiwapụ ọrịa Ebola.
N'ozi ụlọọrụ na-ahụ maka mmekọrịta mba ọzọ na Amerika ziputara n'ụbọchị Tuzdee, ha dụrụ ndị Amerika ọdụ ka ha zere njem ọbụla gaa mba Congo DRC, Saụt Sudan, nakwa Uganda.
Ụlọọrụ ahụ dọkwara ụmụ amaala ya aka na ntị megide injem gaa obodo Rwanda.
Iwu njem a biara dika ụlọọrụ mgbochi mefesa ọrịa nke mba Amerịka bụ 'Centers for Disease Control and Prevention' kwuru n'ụbọchị Mọnde na otu nwa amaala ha na-arụ ọrụ na mba DR Kongo butere ọrịa Ebola.
"N'otu aka ahụ, ụlọọrụ ahụike mba ụwa bụ World Health Organization (WHO) kpọrọ oku n'abalị 17 nke ọnwa Mee, ebe ha kwurụ na ntiwapụ Ebola nke ụdị Bundibugyo bụ ọgbaghara ahụ ike mba ụwa.
Ụdị nje Bundibugyo a dị ụkọ. o nwebeghị ọgwụ mgbochi ọbụla a kwadoro maọbụ usoro ọgwụgwọ maka ya ugbu a, nke na-akpata nchegbu.
Ntịwapụ Ebola na DR Congo aghọọla ọghọm ahụike mbaụwa -WHO
Otu ahụike mba ụwa bụ World Health Organization (WHO) ekwuola na ọrịa Ebola ntiwapụrụ n'obodo DR Congo bụ ihe ọghọm nyere ahụike na mba ụwa niile.
Onyeisi WHO bụ Tedros Ghebreyesus kwupụtara na nje Ebola, nke gbasara n'ọtụtụ obodo gụnyere isi obodo Congo bụ Kinshasa, efeela rute obodo Uganda, ebe a chọpụtara na mmadụ abụọ butere ya.
Ọ dọrọ mba DR Congo na Uganda aka na ntị ka ha hiwe ụlọọrụ gbatagbata iji na-esochi, na-achọpụta, nakwa na-emepe usoro mgbochi ọrịa Ebola.
Ghebreyesus gwara mba ndị gbara mpaghara nwere ntiwapụ Ebola gburugburu ka ha hụ na ha kwalitere usoro nchebe na ịgbasa akụkọ gbasara ezigbo ahụ ike.
Ọ gbakwunyere na mba ndị ọzọ ekwesịghị imechi oke ala ha maọbụ machibido njem na azụmahịa, n'ihi na 'ụdị usoro ahụ na-abụkarị maka egwu, nweghịkwa ntọala na sayensị'.
Ụlọọrụ WHO ekwupụtala ọrịa Ebola tiwapụrụ na DR Kongo dịka ọnọdụ ahụike gbatagbata n'ụwa niile
Otu ahụike mba ụwa bụ World Health Organization (WHO) ekwuola na ọrịa Ebola ntiwapụrụ na mba Democratic Republic of Kongo a bụrụla ọnọdụ gbatagbata n'ahụike ọhanaeze nke na-echere mba ụwa aka mgba ugbua.
Ụlọọrụ ahụ kwuru na ọrịa Ebola ahụ tiwapụrụ na mpaghara Ituri nke dị n'ebe Ọwụwa Anyanwụ DR Kongo, emetụtala ọtụtụ dịka a na-enyo enyo mmadụ 246 na ha nwere ọrịa ahụ ebe ekwupụtara ọnwụ mmadụ 80.
Mana ụlọọrụ ahụ dọrọ aka na ntị na ọ nwereike ịbụ "ọrịa nke tịwapụrụ" karịa ihe a na-achọpụta ma na-akọ ugbu a, yana nnukwu ihe egwu nke ga-agbasa na mpaghara.
E kwuru na ọ bụ nje 'Bundibugyo' na-akpata ọrịa Ebola dị ugbu a, dịka ụlọọrụ ahụike kwuru na nke a enweghị ọgwụ maka ọgwụgwọ ma ọ bụ ọgwụ mgbochi.
E kwukwara na ihe mgbaama mbụ gụnyere ahụ ọkụ, mgbu akwara, ike ọgwụgwụ, isi ọwụwa na akpịrị mgbu, na-esochikwa ọgbụgbọ, afọ ọsịsa, ihe ọkụ na ọbara ọgbụgba.
Ụlọọrụ WHO kwuru na enwere mmadụ asatọ nke a chọpụtara na ha nwere nje ahụ n'ụlọ nnyocha, yana ndị ọzọ a na-enyo enyo na ọrịa ahụ metụtara, ya na ndị o gburu n'ofe mpaghara ahụike atọ gụnyere Bunia isi obodo Ituri, na obodo Mongwalu na Rwampara bụ nke na-egwupụta ọlaedo.
A chọpụtala na otu onye bu ọrịa ahụ bụ onye ọrịa si Ituri na-alọta na Kinshasa, isi obodo ahụ.
Ụlọọrụ ụwa ahụ kwukwara na nje a agbasaala karịa DR Kongo, dịka e kwuru na mmadụ abụọ a chọpụtara na ha nwere ọrịa ahụ na Yuganda dị nso. Ndị ọrụ gọọmenti Yuganda kwuru na otu nwoke dị afọ iri ise na itoolu nwụrụ na Tọzde ka a chọpụtala na ọ nwere nje ahụ.
Ka ọ dị ugbua, e kwuru na mba ndị dị nso na DR Kongo nọ n'ọnọdụ nnukwu ihe egwu n'ihi azụmaahịa na njem.
Mana ụlọọrụ WHO dụrụ ọdụ ka DR Kongo na Yuganda guzobe ebe ọrụ gbatagbata iji na-eme nnyochaa, chọpụta, ma tinye usoro mgbochi ọrịa ahụ.
Ntịwapụ ọrịa Ebola ọhụrụ egbuola mmadụ 65 na DR Congo
Ngalaba na-ahu maka mgbochi ọrịa n'Afrịka bụ CDC Africa ekwuola na e nwere ntịwapụ ọrịa Ebola n'obodo Turi dị n'Ọwụwa Anyanwụ mba DR Kongo dị na Sentral Afrịka.
CDC Africa kwuru na mmadụ dị 246 ebutala ọrịa Ebola na nsonso a, ebe mmadụ 65 nwụrụla.
Ebola bụ ọrịa a na-efekesa site mmiri si n'ahụ mmadụ nke na-ebute oke ịgba ọbara nakwa akụkụ ime ahụ mmadụ ịkwụsị ọrụ.
N'ozi CDC Africa wepụtara ụbọchị Fraide, ha kwuru na ha na ndị DR Kongo, Yuganda na Saụt Sudan ga-enwe ọgbakọ iji kpaa etu ha ga-esi ebu agha megide ọrịa ahụ ma hụ na-eme nnychoa n'okeala mba ndị ahụ.
Nnyocha e mere na ụlọọrụ nnyocha 'Institut National de Recherche Biomédicale' (INRB) dị n'isi obodo DR Kongo bụ Kinshasa, gosiri na nje ahụ dị na sampụlụ 13 n'ime 20 e nyochara dịka Ministrị ahụike mba DR Kongo na ụlọọrụ ahụike ahụ kpachara.
A hụkwara ndị a na-enyo na ha bu ọrịa Ebola na isi obodo Ituri bụ , Bunia, dịka a na-eche mpụtara nnyocha ụlọọrụ nnyocha.
End of Ọrịa ndị ọzọ ụwa na-ebuso agha
A chọpụtara Ebola mbụ n'afọ 1976 n'ebe a na-akpọ DR Congo ugbua bụ ebe e cheburu na ọrịa Ebola sị na ụsụ fee mmadụ.
Njirimara ọrịa Ebola ma o bido gụnyere ahụọkụ, ahụ mgbu, ike ọgwụgwụ, isi ọwụwa na ọnya akpịrị. Ebola enweghị ọgwụgwọ.
Ihe ruru mmadụ 50,000 anwụọla site n'ọrịa ebola n'Afrịka n'afọ 50 gara aga.
N'afọ gara aga (2025) mmadụ 15 nwụrụ na mba ahụ dịka ọrịa Ebola tịwapụtara ọhụrụ agba nke 16 ya.