Kedụ ihe iwu kwuru maka 'stop and search' ndị uweojii na-eme?

Aha onyonyo, Kedụ ihe iwu kwuru maka 'stop and search' ndị uweojii na-eme?
Kedụ ihe iwu kwuru maka 'stop and search' ndị uweojii na-eme?
Mgbe e biputara ya

Okwu banyere agwa ndị uweojii na-akpa n’okporoụzọ abụrụla ihe a kpụ n’ọnụ ugbua na Naịjirịa.

Nke a na-abịa dịka ihe onyonyo fesara na soshal midịa gosiri oge ndị uweojii kwụsịrị ọkwọụgbọala n’okporoụzọ si Benin gawa Legọs steeti ma gwa ya ka ọ chọrọ ya ego.

Onye uweojii gwara ọkwọụgbọala ahụ na ya kara inwụchi ya ma ọ bụrụ na ọ bụ onye Igbo

Ka ọ dị ugbua, onye jibu ọkwa ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Anthony Okon Placid gwara BBC Igbo na anwụchiela ndị uweojii kpara ajọ agwa ahụ ma kwuo na-amalitela ime nnyocha banyere ihe ha mere.

Ihe i kwesịrị ịma dịka ọkwọụgbọala

Mana gị bụ onye ọkwọụgbọala, gịnị ka ikwesịrị ima ma ọ bụrụ na ndị uweojii kwụsị ụgbọala gị n’okporoụzọ iji mee nnoycha ha kpọrọ ‘stop and search’ n’olu bekee?

Anthony Placid Okon kọwara ụfọdụ ikike iwu Naịjirịa nyere ndị uweojii nakwa gị onwe bụ ọgwọụgbọala ma a bịa n’ihe gbasara ọrụ ‘stop and search’.

Nke mbụ, ndị uweojii ọbụla kwụsịrị gị ga-akọwa ndị ha bụ, yiri uwe ndị uweojii, gosi ọkwa ha, ụlọọrụ ndị uweojii ha si nakwa ihe mere ha ji kwụsị gị. Ọ bụrụ na ha emeghị nke a, ha adaala iwu usoro bụ ‘Standard Operating Procedures (SOP)’ nke ụlọọrụ ndị uweojii Naịjirịa.

Ọ bụ eziokwu na iwu Naịjirịa nyere ndị uweojii ikike zuruoke ịrụ ọrụ ‘stop and search,’ mana Anthony Okon Placid kwuru na tupu ndị uweojii emee nke a, a ga-enweriri ihe gosiri na onye ha chọrọ inyocha bụ onye a na-enyo enyo na o nwere ihe o mere.

Ọzọ bụ na iwu Naịjirịa machiri ndị uweojii ịkwụsị ma malite inyocha mmadụ n’ihi ụdịrị uwe onye ahụ yi, afọ ole ọ dị, etu o si hazie ntutu isi ya maọbụ maka ụdịrị ụgbọala onye nwere.

Iwu machiri ndị uweojii ịkwụsị ma malite inyocha ekwentị gị. Naanị oge ha nwere ikike ime nke a bụ ma ọ bụrụ na ụlọikpe nyere ha akwụkwọ ikike maọbụ na ị bụ onye ụlọọrụ ndị uweojii na-enyocha.

Ọ bụ naanị onye uweojii nwaanyị nwere ikike iji aka ya nyochaa nwaanyị n’ihi na iwu megidere onye uweojii nwoke iji aka ya enyocha nwaanyị ọbụla.

Onye uweojii ọbụla gwara gị nye ya aka azụ a kpọrọ ‘bribe’ n’olu bekee, adaala iwu. Anthony Okon gwara gị gaa kpesa onye dị etu n’ụlọọrụ ndị uweojii.

Anthony Okon Placid kwuru ka i rube isi ma ndị uweojii kwụsị ma ghara ịlụso ha ọgụ.

Ọ bụrụ na e nwere agwa ọjọ onye uweojii kpasara gị, ọ dị mkpa ka inweta aha nakwa akara ọkwa onye uweojii dị etu a ma gaa n’ụlọọrụ ndị uweojii mee mkpesa maka ya.

Ọzọ dịka ibe ya bụ na i nwere ikike iji ekwentị gị na-ese ihe onyonyo oge ndị uweojii kwụsịrị gị maka stop and search. Nke a bụ iji nwee ihe akaebe ma ọ bụrụ na ndị uweojii malite ịkpa ajọ agwa megide gị.

Anthony Okon Placid kọwara na ọ dị mkpa ka onye ọbụla mara ma jide akara ekwentị ụlọọrụ nhazi a kpọrọ ‘control room’ na bekee nke mpaghara ọbụla ha bi. Iji nweta akara a, o kwuru ka ị kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti gị iji nweta ya.