Ị gaghị eji ndụmọdụ soshal midịa eso alụmdi na nwunye gị - Jerry Eze

Aha onyonyo, Ị gaghị eji ndụmọdụ soshal midịa eso alụmdi na nwunye gị - Jerry Eze
Ị gaghị eji ndụmọdụ soshal midịa eso alụmdi na nwunye gị - Jerry Eze
Mgbe e biputara ya

Onyeisi ụlọụka Streams of Joy bụ Pastọ Jerry Eze ekwuola etu ekpere nne ya kpeere ya si gbanwee ndụ ya ma mee ya ihe ọ bụ taa.

Na mkparịtaụka ya na BBC News Igbo nwere, Pastọ Jerry Eze kwuru na dịka nwatakịrị, nne ya ekweghị ya ka o soro ụmụaka ndị ọzọ gwuo egwuregwu.

O kwuru na nne ya gwara ya na ọkpụkpọ oku Chukwu nọ na ndụ ya.

"Nne m jidere m aka n'ụkwụ ma na-ekpere m ekpere oge m na-ehi ụra dịka nwatakịrị, ọ bụ anya mmiri si ya n'anya tụsara m n'ụkwụ na-akpọlie m n'ụra oge ahụ, o mere ya ugboro ugboro", ka Pastọ Jerry kwuru.

N'agbanyeghị na nne ya anwụọla, Pastọ Jerry kọwara nne ya dịka odogwu ya.

Ọ gwara anyị etu ụlọụka Streams of Joy si malite ma kwuo na ndị maọbụ onye ọbụla na-ekwu na aka Chukwu adịghị n'ụlọụka ya, amaghị ụdịrị ekpere nne ya kpere n'isi ya oge ọ dị ndụ.

Ọ gakwara n'ihu kwuo maka nnyocha ụlọọrụ EFCC nyochara ya na nso nso a.

Banyere ego enyeamaka 'grant' ahụ o nyere ndị azụmahịa, Pastọ Jerry kwuru na ego grant ahụ abụghị mmemme ụlọụka ma kọwaa ihe mere o ji họpụta ụlọọrụ KPMG dịka ndị mere nnyocha ma họpụta ndị ritere nwetara ego ahụ.

N'okwu ya "Achọghị m ka ndị ọrụ n'ụlọụka m jiri aka ha họpụta ndị ga-erite ego grant ahụ maka na achọghị m akụkọ, ọ bụ nke a mere m ji kwado ka ụlọọrụ KPMG jiri aka ha nyochaa ma họpụta ndị tozuru inweta grant ahụ anyị nyere".

Pastọ Jerry gwara anyị etu ya na nwunye ya bụ Eno Jerry Eze si zute onwe ha oge ha nọ mahadum. O kwuru na ọ gwara ya na Chukwu agwala ya na ọ ga-abụ nwunye ya.

"Ngwa ngwa m gwara ya ihe Chukwu gwara m, ọ hapụrụ m gbapụ ọsọ. Ọ bụ ka abalị ole na ole gara ka ọ bịara gwa m na Chukwu agwala ya na ha abụọ ga-alụ onwe ha, ka Pastọ Jerry kwuru.

Foto Pastọ Jerry Eze oge mkparịtaụka ya na BBC nwere
Nkọwa foto, Foto Pastọ Jerry Eze oge mkparịtaụka ya na BBC nwere

O kwuru na ọ hụrụ nwunye ya n'anya nke ukwuu ma kọwaa na ihe niile banyere nwunye ya na-amasị ya.

Pastọ Jerry kọwara onwe ya dịka ezi nna hụrụ ụmụaka ya n'anya nke ukwuu.

Ọ gara n'ihu nye ndụmọdụ banyere alụmdi na nwunye ma kọwaa na ọ bụ naanị alụmdi na nwunye na-eso ụzọ Kraịst bụ nke ga-abụ ọkaibe.

"Onye ọbụla nọ n'alụmdi na nwunye taa kwesiri ịmata na onye ha lụrụ bụkwa mmadụ nwereike iri mperi. I kwesịrị ịgbaghara di gị maọbụ nwunye gị ngwangwa oge ọbụla ha mejọrọ gị".

"Anyị agaghị eji ndụmọdụ soshal midịa eme alụmdi na nwunye, ọ bụghị etu Chukwu siri chọọ ya", ka o kwuru.

Ebumnobi Chukwu bụ ka gị na di gị maọbụ nwunye gị, rụọ ọrụ ma zụpụta ụmụaka unu n'ụzọ iwu Chineke".

Pastọ Jerry gwara anyị ihe mere n'oge ikpeazụ ya na nne ya hụrụ tupu ọ nwụọ.

"Nne m kpeere m ekpere ruo nkeji iri atọ maọbụ karịa oge ikpeazụ mụ na ya hụrụ, ekpere ahụ o kpere m bụ nke m agaghị echefu na ndụ m".