Ihe anyị ma maka nwataakwụkwọ nọọsụ e bepụrụ isi n'Imo Steeti
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist and Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Ndị obodo Ụmụlogho dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Obowo n'Imo Steeti ejirila iwe na ọnụma zọọ njem ngagharịiwe gbasara ogbugbu e gburu nwataakwụkwọ nọọsụ na College of Nursing Sciences Ụmụlogho, aha ya bụ Wendy Achumba ma bepụ ya isi.
Eze obodo ahụ bụ Patrick Ngozi Uwalaka, ndị ndu obodo, ndị nne, ndị ntoroọbịa na ndị niile nwere obi mmadụ bi n'Ụmụlogho zukọtara n'ogige Ugobueze Triangular Centre iji gbapụ ụrịọm maka ogbugbu e gburu nwaakwụkwọ nọọsụ ahụ.
Nke a na-eme dịka otu onyonyoo fegharịrị na soshal midịa gbasara ogbugbu e gburu Wendy Achumba, nwaafọ Ngwa dị n'Abịa Steeti n'ụlọ ya dị n'Ụmụdara Ụmụlogho n'ehihie Tọzde 21 Mee 2026, dịka e bepụrụla ya isi.
N'ụbọchị Fraịde 22 Mee 2026 ka ụlọakwụkwọ College of Nursing Sciences Ụmụlogho wepụtara ozi ma kwuo na obi agbawaala ha gbasara ọnwụ Wendy. Ha kasiri ezinaụlọ ya obi ma kwuo na ha enyela mkpesa n'ụlọọrụ ndị uweojii.
N'ozi ndị uweojii Imo Steeti wepụtara n'ụbọchị Tọzde ahụ, ọnụ na-ekwuru ha bụ Henry Okoye sịrị na ha nụrụ maka njinji ahụ ma gbara ọsọ gaa ebe ahụ iji were anya ha hụ. O kwuru na ndị uweojii butere ozu nwaagbọghọ ahụ ma bugaa ya n'ọbaozu, dịka ha maliterela ime nnyocha iji chọpụta ndị aka ha dị n'arụ ahụ ma nwuchie ha.
Ndị uweojii rịọrọ ụmụakwụkwọ na ọhanaeze ka ha dere duu, ma kwee nkwa na ha na-agbasi mbọ ike iji hụ na ndị kpara arụ ahụ gbara nkwa nke iwu obodo ga-akụrụ ha.
Kepukepu na-ekwu na aka akparala ndị aka ha dị n'arụ ahụ, mana o nwebeghị ihe ndị uweojii kwuru gbasara ya.



