Iwu hibere uweojii steeti: Ọsịsa maka ajụjụ atọ gbara ọkpụrụkpụ i kwesiri ịma

Ebe foto si, Getty Images
Kemgbe Wenezde, Juun 28, 2026 ndị Ụlọomeiwu Ukwu Naịjirịa binyere aka n'akwụkwọ iwu maka ihibe ndịuweojii nke steeti, o butere ihe mgbagwoju anya nke kpalitere ajụjụ dị iche iche.
Ajụjụ ndị ahụ gụnyere: Ebe ka ego a ga-akwụ ha ga-esi abịa? Ha aga ebu egbe ka ọ bụ mgbọrọ maọbụ mkpara osisi ka ha ga-eji arụ ọrụ?
Ajụjụ ndị ọzọ bụ na ndị nche steeti dịka Agu-na-eche-mba, Hisbah kaọbụ Amọtekụ a ga-agbanwe bụru ndị uweojii steeti?
Ọkaiwu Oge Agbazue bụ onye ma nke ekwe na-akụ banyere nchekwa nyere ọsịsa maka ajụjụ ndị ahụ.
1. Ọ bụ eziokwu na ndị uweojii steeti agaghị ebu egbe?

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na-efegharịrị kwuru na ọ bụ osisi maọbụ mgbọrọ nke ọtụtụ na-akpọ mkpara osisi ka ndị uweojii steeti ga-eji arụ ọrụ; mana Ókaiwu Oge Agbazue kwuru na nke ahụ bụ okwu asị.
"Ọ bụrụ na Agụnechemba na-ebu egbe , gịnị mere na ndịuweojii steeti agaghị ebu egbe? Ha ga-ebu egbe. A ga-enye ha ezigbo ngwaọgụ."
2. Ọ bụ otu nche Agụnechemba, Amọtekụn maọbụ Hisbah ga-aghọ ndị uweojii steeti?

Ebe foto si, Getty
Otu n'ime akụkọ na-efegharị kemgbe e kwubere okwu na-amapụtala ndị uweojii steeti bụ na ọ bụ ndị otu nche steeti na mpaghara dị iche iche na Naijiria dịka Agụnaechemba(Ọwụwa Anyanwụ), Amotekun (Ndịda Ananywụ)na Hisba (Ugwu Awụsa) maka igbo ọgụ ndakpọ nchekwa ga-aghozị ndị uweojii steeti.
Mana dịka Ọkaiwu Agbazue onye bụbụ Onye Uweojii sịrị mba.
" Agụnechemba nọrọ onwe ha, ọ bụrụ na ha chọọ ịbanye na ndị uweojii steeti, ha agba aụkwaghịm tupu ha banye ọrụ uweojii steeti."
"
Kedụ ebe ego ụgwọọnwa ndị uweojii ga-esi abịa?

Ebe foto si, Getty Images
Ajụju ọzọ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ bụ "Ebe ka ego a ga-eji akwụ ndị uweojii ụgwọ ọnwa ga-esi?"
Ọkaiwu Agbazue sara sị,"Tupu gọọmenti ehiwe, ndị uweojii steeti, ha amapụtal etu a ga-esi akwụndị uweojii steeti."
Mana Ọ gbazueo , onye rụtụrụ aka na e nweburu ndị uweojii rue n'okpuru ọchịchị ọ na-atụ uche na gọọmentị steeti nwere ike ha agaghị enwe ego iji akwụ ndị uweojii ụgwọnwa, nke ọ sịịnwere ike ime ndị uweojii seeti ha etinyewe aka n'ihe ekwesịghị.
t
Lee ngalaba iwu ndị uweojii steeti machiri Gọvanọ i ji ya amaja ndị ọzọ

Ebe foto si, Nigeria Senate and Nigeria Police Force / facebook
Otu n'ime ngalaba iwu ndị uweojii steeti nke ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa kwadoro machiri ndị gọvanọ i ji maka na ha nọ n'ọkwa na-amaja ndị na-agba ọchịchị ha ụkwụ maọbụ ndị anọghị n'ọchịchị.
Ngalaba bekee kpọrọ "section 17 (6) kọwara etu ndị gọvanọ na ndị kọmịshịọna uweojii na steeti ha ga-esi na-arọkọ ọrụ.
Ọ sị na "Gọvanọ nwereike igwa Kọmịshịọna ka o mee ihe site na ị de ya ede. Ihe ahụ ọ ga-asị ya mee ga-abụ ihe metụtara nchekwa na ọdịmma ọhanaeze na steeti ọ na-achị".
Mpaghara iwu ahụ rụtụkwara aka n'egwu ndị nkịtị, ndị ntaakụkọ maọbụ ndị anọghị n'ọchịchị na-atụ.
O gbochiri Gọvanọ iji ndị uweojii steeti na-ejide ndị mmadụ maka na ha katọrọ ya maọbụ ọchịchị ya n'udi na-adịghị n'iwu obodo.
Ngalaba "Section 17(7)" kwuru "hoo haa na kọmịshịọna uweojii agaghị ejide, jichie, nnyochaa maọbụ jiri ike agha steeti ha megide onye ọbụla n'usoro adịghị n'iwu maka naanị na onye ahụ katọrọ ọchịchị gọọmenti".
Ụlọomeiwu Sineti akwadola iwu ga-enye steeti niile ikike ihiwe ndị uweojii nke ha
Ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa akwadola iwu ga-enye steeti niile ikike ihiwe ndị uweojii nke ha nke bekee kpọrọ "State Police".
Nke a na-eme n'ọgbakọ ndị Sineti nwere taa n'Abuja.
Iwu ọhụrụ ahụ gbawere iwu Naịjirịa nke afọ 1999 ma nye ohere ka steeti niile nweike iguzobe ụlọọrụ ndị uweojii na steeti ha dị icheiche.
Kedụ ihe dị n'iwu 'State Police'?
Kedụ ihe bụ ndị uweojii 'State Police' gọọmenti Naịjirịa chọrọ ihiwe?

Ebe foto si, Nigeria Police/Facebook
Ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa ga-atulee, kpebie ma kwado atụmatụ imegharị iwu NaỊjirịa iji hiwe ngalaba nchekwa a kpọrọ 'State Police' n'olu bekee dịka ha ga-enwe ọgbakọ n'ụbọchị Wenezde 24 Juun, 2026.
Ụlọomeiwu Sineti gara n'ihu nyefe atụmatụ imegharị iwu ahụ n'aka kọmitii ya na-ahụ maka iwu ka ha lebanye anya.
Nke a na-abịa dịka Onyeisiala Bola Tinubu zigaara ụlọomeiwu ahụ akwụkwọ atụmatụ mmegharị iwu ahụ.
Atụmatụ a bụ nke e ji chọọ ilebanye anya n'iwu Naịjirịa ma hazie ya ma kwado nhiwe ngalaba nchekwa state police ahụ na Naịjirịa.
Cheta na ụlọomeiwu nta Naịjirịa akwadola atụmatụ imegharị iwu ahụ n'ụbọchị Wenezde 10 Juun, 2026.
Gịnị ka iwu State Police ga-eme?

Ebe foto si, Nigeria Senate / facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ihe iwu a chọrọ ime gụnyere:
* Inye steeti niile dị na Naịjirịa ikike ihiwe ma kwado ndị ọrụ uweojii nke ha iji hụ maka ezi nchekwa na steeti ha dị iche iche.
* Ọ bụrụ na e hiwe ụlọọrụ state police a, ọ ga-abụ Gọvanọ steeti nwereike ịchụ maọbụ họpụta onye ga-abụ kọmishọna ndị uweojii na steeti ha dị iche iche.
* A ga-ehiwe ụlọọrụ National State Police Commision (NSPC) ga na-achịkọta ọrụ ndị uweojii state police na Naịjirịa.
* Iwu a na-ekwu na ụlọọrụ ndị uweojii Naịjirịa a kpọrọ Nigeria Police Force n'olu bekee, ga-abụzi ụlọọrụ Federal Police ebe aha ụlọọrụ ndị uweojii nke steeti nwee ga-abụzi State Police.
* Iwu a ga-egbochi ndị uweojii etiti itinye anya n'ihe gbasaraọrụ state police na steeti ọbụla.
* Iwu a na-ekwu na onweghị ndị uweojii state police agaghị amalite ọrụ ruo mgbe ụlọomeiwu steeti mapụtara iwu ga-ehiwe ha nke ga-erube isi nye iwu ụlọomeiwu etiti.
* Iwu a wepụtara usoro dị iche iche ndị ọchịchị steeti ga-esi nweta enyemaka ndị ọrụ Federal Police.
Ka ọ dị ugbua, ihe gbasara ọrụ nchekwa na Naijirịa bụ ndị uweojii Federal Police na-ahụ maka ya ruo oge e hiwere ndị uweojii steeti.

Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook
Kemgbe ọtụtụ afọ, steeti dị iche iche na Naịjirịa malitere ịkpọ oku ka steeti nwee ndị ọrụ nchekwa nke ha n'ihi oke mkpamkpa na mwakpo ndị ojiegbe na-eme na mpaghara Naịjirịa dị iche iche kemgbe ọtụtụ afọ.
Ụfọdụ otu civil society organization n'olu bekee sokwa na-akpọ oku a.
Cheta na ndị ojiegbe a atọrọla, bibie ọtụtụ ụgbọala, ụlọ obibi ma gbukwaa ọtụtụ mmadụ gụnyere ụmụaka.
Nke a mere ka steeti ụfọdụ hiwe ndị ọrụ nchkewa 'Amotekun' na mpaghara ndịda ọdịda anyanwụ Naịjirịa, Ebube Agu na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, nakwa ndị ọrụ nchekwa 'Hisbah' na mpaghara ugwu Naịjirịa.
Mana nke bụ eziokwu bụ na ọbụghị mmadụ niile na-akwado ka e hiwe ụlọọrụ state police a na Naịjirịa. Ụfọdụ kwenyere na ya ebe ụfọdụ ndị ọzọ katọrọ ya.





























