Ụlọikpe mba UK ekwuola na ọgbaegwu Poco Lee ga-apụta zara ọnụ ya maka ebubo mmetọahụ

Iweh Pascal Odinaka bụ ọgbaegwu Naịjirịa a maara dịka Poco Lee

Ebe foto si, Poco Lee/Instagram

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụlọikpe mba United Kingdom bụ Snaresbrook Crown Court ekwuola na onye ọgbaegwu a ma ama bụ Iweh Pascal Odinaka, nke ọtụtụ maara dịka Poco Lee, ga-apụta n'ihu ụlọikpe n'ọnwa Septemba na-abịa abịa iji zara ọnụ ya maka ebubo mmetọahụ.

Ụlọikpe ahụ kwupụtakwara na Poco Lee ga-apụta zara ọnụ ya n'ụbọchị Tuzde abalị iri na ise n'ọnwa Septemba 2026.

N'akwụkwọ ozi ụlọikpe nyere BBC News Pidgin, ka o kwuru na Poco Lee ga-azara ọnụ ya maka ebubo dị iche iche ma nwetakwa ohere ịgwa ụlọikpe ma o kwetara ebubo ndị ahụ ka ọ ga-agọnarị ha.

Akụkọ ka na-abịa...