Aghara m na-eme anaghị eru n’ezinaụlọ m - Charles Okocha

Aha onyonyo, Anaghị m eme aghara a ma na-eme n’ezinaụlọ n - Charles Okocha
Aghara m na-eme anaghị eru n’ezinaụlọ m - Charles Okocha
Mgbe e biputara ya

Charles Okocha bụ onye na-eme ejije a ma ama, kọwaara BBC Igbo etu njem ya dịka onye na-eme ejije si malite n'afọ 1998.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, Charles Okocha kwuru na ya malitere ime ejije maka na ya hụrụ ọtụtụ ndị na-eme ejije gụnyere Ramsey Noah, Kate Henshaw na RMD ma chọọ ịdị ka ha.

O kwuru na oge ọ dị na nwata, ọ bụ onye otiegwu ka ọ chọrọ ịbụ.

"Oge m dị na nwata, ọ bụ egwu ka m chọrọ ị na-agụ. Ọ bụ egwu mana etu ihe nkiri a sị malite. Oge ahụ ana m ahụ Ramsey Noah, Kate Henshaw na ndị ọzọ gụnyere RMD. Ha bụ ndị m na-elegara anya. Anyị na-ekiri ha TV. Asịrị m na ndị a na-eme ọfụma. Ọ bụ ya mere m ji chọọ ịdị ka ha".

Ọ kọwara etu o si zute onye na-ahazi ejije aha ya bu Teco Benson nakwa etu o si nye ya ohere ime ejije mbụ ya.

"Otu ụbọchị, anọ m na Surulere mana amaghị na onye nhazi ejije Teco Benson bi nsọ n'ụlọ m. Ọ na-apụta n'ụlọ ya, ana m ahụ ndị na-eme ejije m na-ekiri na TV ka ha kwụrụ n'ihu ụlọ ya, ka Okocha kwuru.

"Agwara m ya na m chọrọ ị na-eme ejije. N'ime ụbọchị abụọ, ọ gwara m na a na-eme ntule audition n'ebe a na-akpọ Nepa Junction dị n'Aguda Surulere".

Charles Okocha ji ohere mkparịtaụka a kọwaa ụdịrị ịhụnanya o nwere n'ebe nne ya, nwa ya nwaanyị nakwa nwa nwoke nọ.

Ọ gara n'ihu kwuo maka nwunya ya nakwa ụmụaka ya ndị ọ mụrụ tupu ọ lụọ.