Etoro m n'ihu ọha dịka nwata na-eme ejije - Ikenta

Aha onyonyo, Etoro m n'ihu ọha dịka nwata na-eme ejije - Ikenta
Etoro m n'ihu ọha dịka nwata na-eme ejije - Ikenta
Mgbe e biputara ya

Nwoke a maama na ngalaba ejije na Naịjirịa aha ya bụ Chukwudi Okoro Nnabuike gwara BBC etu o si too nakwa ihe ndị ụfọdụ na-eme na ndụ ya dịka onye na-eme ejije.

Ọ gwara BBC nke a na mkparịtaụka ma kwuo na mgbe ụfọdụ na ya na-echefu na ya bụ onye a maama.

N'okwu ya "aha m bụ Chukwudi Okoro Nnabuike ihe e ji mara m n'ihe ejije m na-eme bụ ikenta".

"A bụ m onye Enugwu steeti. E si na Newe, n'okpuru ọchịchị Aninri".

"A gara m akwụkwọ praịmarị na Idaw river, gaa mahadum na IMT, Institute of management and technogy n'Enugwu ebe a. Ihe m gụrụ bụ 'accounting" A na m eme ejije. Ọ ihe e ji mara m. Ọ ihe bidoro n'ụmụaka na-eme"

A nọ na-agwa enyi m nwoke na ime ejije na-amasị. Na a chọrọ ka ndị mmadụ na-ekiri m n'onyoonyo.

Ọ sị na e nwere nke nwanne ya nwaanyị so mee, aha ya bụ "broader line". Ọ gara m ụlọ oriri na nkwari ahụ bụ ebe m ga-eje. Ebe ahụ ka a na-ahọrọ ndị ga-eso eme ejije n'Enugwu.

Etua ka m si bido tupu m emee nke m na Nkem Owoh mere buputere m. A zara m nkenta na nke ahụ mechere nara aha m.

Ọ dị gị ka a na-akwasa mmadụ iko tupu o soro mee ejije?

Ọ sị na "Ikwaso iko tupuu mmadụ osoro na-eme ejije bụ ihe na-eme eme na ngalaba ime ejije ,mana ọ bụ ihe onye chọrọ ka ọ fụ".

"I bido ime ejije mana ihe dị gị n'obi bụ na ị chọrọ ka gị na ndị isi okpookpo na-emekọ i kwesiri ịma na ya na ihe so.

"Maka na e nwere ihe a na-ewepụ n'anụ nwere eri anụ, mana ọ bụrụ na ị bidoro iso eme ejije ma nọrọ onweghị, ụbọchị a kpọrọ gị ọrụ ị gaa, ụbọchị akpọghị gị ị nọrọ, onweghị onye ga-asị gị mee udi ihe ahụ.

"Ọtụtụ oge m na-echefu na m bụ onye a maama.

"O were ebe m na-eje eri nri, ọtụtụ ndị ọnyị hụrụ m ebe ahụ sị m na m akarịala ị na-abịa ebe ahụ; a gwara m ha hapụ m aka na nke a bụ maka ndụ m, na nri nwaanyị ahụ na-atọ ụtọ, ọzọ bụ na ọ ma esi nri.

"Ọ bụghị maka na m na-eme ejije. M bịa zụrụ nri m alaa, mana ọ bụrụ na ị na-ahụ m ka chukwu nke ahụ gbasara gị".

Kedụ ihe anyị amaghị maka Ikenta?

"Ofu ihe maka Ikenta Chukwudi Nnabuike Okoro ndị mmadụ amaghị bụ na m bụ ezigbo onye ekpere. Ọ bụrụ na ọbụghị na m na-eme ejije, ihe m aka abụ bụ onye ụkọchukwu".

Mana mgbe BBC jụrụ ya na ọnụọla nwaanyị ka ọ sị "Ikenta anụbeghị nwaanyị. Mana ọ dị n'ihe m ga-eme. Ọ na-amasị m ime ihe n'usoro. Mgbe oge ya ruru a ga m eme ka ụwa niile mara".