Livinus Nwosu: A tọhapụla nwaokoroọbịa a nwuchịrị na-akụziri ndị Naịjirịa ịkwụsị ire vootu

Livinus Nwosu bu akpa ya na-agagharị n'ụzọ, ọ bụ nwa Igbo bi na Bayelsa steeti mana ihe e jiri mara ya bụ ikuzi ndị mmadụ ihe dị njọ ire vootu ha.

Ebe foto si, Livinus Nwosu

Nkọwa foto, Na nsonso a ka nwamadị ndị ụlọọrụ DSS tọhapụrụ nwaamadị a na-akpọ Livinus Nwosu.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Na nsonso a ka ndị ụlọọrụ DSS tọhapụrụ nwaamadị a na-akpọ Livinus Nwosu.

N'ụbọchị Wenezde Juun 3 ka akụkọ malitere ifesa na soshal midịa na ụmụnwoke ji egbe, ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ọrụ nchekwa, bịara kpụrụ Nwosu na Bayelsa Steeti.

Ndị mmadụ maara Livinus Nwosu site n'akara soshal midịa ya ebe ọ na-agbasi mbọ ike n'ịgba ndị Naịjirịa ume ka ha nweta akwụkwọ ikike ịtụ vootu (bụ PVC) maka ntuliaka na-abịa n'afọ 2027 nakwa onye ọgụ ọ na-alụ megide omume rụrụ arụ nke bu ịzụ na ire vootu.

Martins Vincent Otse aka VDM, a ma dịka onye na-eji

Ebe foto si, Martins Vincent Otse aka VDM

Nkọwa foto, Martins Vincent Otse VDM

Nwosu gosiri n'akara Facebook ya, na ọ bụ onye Imo Steeti mana ebe o bi ma na-arụ ọrụ kemgbe afọ iri abụọ gara aga bụ na Bayelsa Steeti.

Ka e jidere Nwosu, onye otu ya na-agbachitere ikike mmadụ bụ Martins Vincent Otse, a maara nke ọma dị ka VeryDarkMan, tiri mkpu na soshal midịa na-ekwu na ọ bụ mkpọkọta ọha Nwosu na-akwado mere e ji kpụrụ ya.

N'ụbọchị Tọzde 4 Juun 2026, ozi pụtara na a tọhapụla Nwosu.

Livinus Nwosu yi uwe ọcha na uwe ogologo ụkwụ

Ebe foto si, Livinus Nwosu

Nkọwa foto, Livinus Nwosu

Ka a tọhapụrụ ya, Nwosu n'onwe ya kọrọ n'ime ihe onyonyo o tinyere na 'Facebook' ya na ọ bụ ndị ọrụ Department of State Services (DSS), nke Bayelsa bịara kpụrụ ya.

O kwuru na a kpụụrụ ya maka ebubo ịkpali ọgbaghara n'etiti ọhanaeze megide gọọmentị.

N'ihe onyonyo ahụ, Nwosu kwuru na otu onye ọrụ nchekwa dọrọ ya aka na ntị na ọ bụrụ na ọ gaa n'ihu na-agbasa ozi ya, ọ ga-ebute nnukwu nsogbu ma ọ bụrụ na e jide ya ọzọ.

Ka ọ dị ugbu a, ndị ọrụ DSS enyebeghị nkọwa zuru oke gbasara ihe mere ha jiri jide ya.

Nke a abụghị oge mbụ ndị ọrụ nchekwa na-ejide Livinus Nwosu. N'ọnwa Maachị afọ 2026, a kọrọ na ụlọikpe tụrụ ya mkpọrọ ụbọchị iri atọ maka ozi na-akpasu iwe o bipụtara na sohal midịa gbasara nwunye gọvanọ Bayelsa Steeti, bụ Gloria Diri.