Kenya ga-achụla ndị mbịarambịa na-ejighị akwụkwọ ikike ịrụ ọrụ
Gọọmenti mba Kenya ekwuola na ha ga-ebido ịchụla ọtụtụ ndị mbịarambịa na-ejighị akwụkwọ ikike arụ ọrụ na mba ha.
Mịnịstrị na-ahụ maka azụmaahịa na mba Kenya gwara ndị mbịarambịa na inwete akwụkwọ ikike visa na-efu abụghị na ha bata na Kenya, ha ebido na-arụ ọrụ na-ejighi akwụkwọ ikike.
N'aka nke ọzọ, Onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto kwukwara na ya enyela ndị mbịarambịa ji ego achụ nta ego na mba ahụ na-enweghị akwụkwọ ikike ụbọchị ikpeazụ ịkwụsị ọrụ.
Mana ọ bụ gịnị na-akpọtụ na mba Kenya?
Gọọmenti mba Kenya chọrọ ịkwụsị ndị mbịarambịa nwere obere azụmaahịa dị icheiche dịka ọrụ mbugharị ngwaahịa n'okporoụzọ, ọrụ ndị ọzọ dị icheiche ma ntakịrị ụlọọrụ maọbụ ụlọahịa ọ bụ ndị mbịarambịa mepere mana ha enweghi akwụkwọ ikike imepe ya maọbụ ịrụ ọrụ n amba ahụ.
Odeakwụkwọ n'ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ na ịtụmgbere na mba Kenya bụ Lee Kinyanjui kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ na-esi mba ọzọ abata Kenya na-eji aghụghọ abata dịka ndị njem nlegherị anya maọbụ ndị na-etinye ego, mechara na-achụ nta ego na-ejighị akwụkwọ ikike.
N'okwu ya "na mmadụ nwetere akwụkwọ ikike visa efu apụtaghị na onye ahụ ga-ebido na-arụ ọrụ, na-atụ mgbere maọbụ ihe na-adịghị n'akwụkwọ ikike o nwere".
Gọọmenti mba kenya gakwara n'ihu kwe ndị niile nwere akwụkwọ ikike kwesiri ekwesị nkwa na aka ike ahụ agaghị emetụta ha.
Etu ihe a niile si bido?
Cheta na ụlọọmeiwu mba Kenya na-etinye ọnụ n'atụmatụ iwepụta iwu ọhụrụ nke ha kpọrọ "Local Content Bill" n'olu bekee.
Ebum n'obi iwu ahụ bu ime ka ụmụafọ mba Kenya nwete ohere ịrụ ụmụ ntakịrị ọrụ ma mee ka ụlọọrụ maọbụ ụlọahịa nke ndị mbịarambịa nwe na mba Kenya bụrụ ndị ga-enyere ụlọọrụ ụmụafọ mba ahụ nwe na ndị ọrụ ha aka.
Mana iwu ahụ ka nọ n'ụlọomeiwu ugbua.



