Ọrịa Ebola napụrụ m nwaanyị m chọrọ ịlụ na ụmụ ejima anyị - Onye gbanarịrị ọrịa Ebola

Aha onyonyo, Ọrịa Ebola napụrụ m nwaanyị m chọrọ ịlụ na ụmụ ejima anyị - Onye gbanarịrị ọrịa Ebola
Ọrịa Ebola napụrụ m nwaanyị m chọrọ ịlụ na ụmụ ejima anyị - Onye gbanarịrị ọrịa Ebola
Mgbe e biputara ya

Chukwuemeka Akagha Dennis bụ nwoke gbakere site n'ọrịa Ebola dị ọjọọ na Naịjirịa.

Na mkparịtaụka pụrụiche nke nwaamadi a na BBC News Igbo nwere ka ọ kọwara na ọrịa ahụ napụrụ ya nwaanyị ọ chọrọ ịlụ nke aha ya bụ Justina Ejelonu na ụmụ ejima ha na-atụ anya n'oge ahụ.

Dennis kwuru na nwaanyị ọ chọrọ ịlụ bụ Justina bụ otu n'ime ndị nọọsụ lekọtara nwoke ahụ bụ Patrick Sawyer bụ onye butere nje Ebola na Naịjirịa n'afọ 2014.

Ọ sịrị na ọtụtụ mmadụ gwara ya ka ọ hapụ Justina mgbe ọ butere ọrịa ahụ, mana ya jụrụ ime nke ahụ n'ihi ịhụnanya o nwere n'ebe nwaada ahụ nọ.

Dennis kwuru na ya mechakwara bute nje Ebola, ma gbakee mgbe o nwetechara ọgwọgwọ.

Ọ sịrị na ọrịa ahụ gbanwere ndụ ya, ma mee ka ọ kwụsị ịtụ ọtụtụ ihe egwu.

"Ebola napụrụ m ihe kacha mma na ndụ m, mana o gbughị olileanya m," ka Dennis siri kwuru.