Kenneth Okonkwo: Ahụhụ eruola na Nigeria nke na ụmụnne Tinubu agaghị atụnyere ya

Kenneth Okonkwo
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Kenneth Okonkwo, ọnụ na-ekwuru otu achụmtavootu Atiku Abubakar bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu ADC na ntuliaka 2027 ekwuola na ọnọdụ akụnaụba Nigeria adaala nke na ndị Ọdịda Anyanwụ bụ ebe Onyeisiala Bola Tinubu si, agaghị atụnyere ya na ntuliaka 2027.

Okonkwo,onye kwuru nke oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka na nsonso a sịrị,"Ahụhụ eruola na Nigeria na ndị bụ ụmụnne Tinubu, agaghị atụnyere ya."

"O nwere onye isi dị mma ga-atụnye vootu ya ka ọ kwụwa N1500 maka otu lita mmanụ ụgbọala?"

''A lafuru Peter Obi lanye ya na NDC'

Kenneth Okonkwo

Okonkwo boro ebubo na ọ bụ otu APC hiwere NDC ji tisaa ndị pati anọghị n'ọchịchị.

"APC mebere NDC ka e were ya tirie ndị pati anaọghị na Gọọmentị mana ha ahụla na ọ kụọla n'ala."

Nwaamadi ahụ bụbu ọnụ na-ekwuru Peter Obi bụ onye na-akwa ọkwa Onyeisiala n'aha otu NDC katọrọ Obi maka ịsi ADC gafee otu NDC, ma kwuo na o nweghị ezi mkparịtaụka tupu ọ banye na pati ahụ.

"Nwanne anyị bụ nlafu ka ha lafuru ya, kemgbe ọ nọ ebe ahụ, o nweela udo?"

"Ihe na-eme na NDC na-agbagwojugodi ma ndị NDC anya maka na ha akpaghị akpa were banye na ya."

Akụkọ ka na-abịa

'Ndị Ọwụwa Anyanwụ kwesịrị ịdọnyere Atiku ukwu nweta ọbụladị ọkwa Osote Onyeisiala'

Kenneth Okonkwo na Atiku Abubakar ebe ha na-ekwe n'aka
Nkọwa foto, Kenneth Okonkwo na Atiku Abubakar

Okonkwo kwuru na dịka ọ fọrọ ndị Ndida Anyanwụ afọ anọ tupu ikike ọchịchị agaghachi n'Ugwu Naijiria, na ọ kara mma onye ọbụla ịkwado ka Ọwụwa Anyanwụ nweta ọbụladi ọkwa Osote Onyeisiala.

"Eso m na ndị lụrụ ọgụ rue ebe nwaafọ ga-alụrụ ndị be ha."

" Mana ugbua, Tinubu nọ n'okwa. Ya mere ihe anyị ga-eche na mbụ bụ kedụ ka anyị niile nọ n'obodo a ga-esi jikọta ọnụ ka e were wepụ ya."

"Ebe ọ bụ na Ndịda Anyanwụ ewelula afọ anọ,onye Ugwu meriri na ntuliaka imeụlọ (ADC), afọ anọ ka ọ ga-eme, ọ bụrụgodi na anyị enwetaghị onyeisi, anyị ewere nke Osote ya ka Tinubu si were mee."

"Ha chịa afọ anọ, ha ewere nye anyị."