Lekwa etu ọnọdụ mba Sudan dị afọ atọ agha obodo malitere

Aha onyonyo, Lekwa etu ọnọdụ mba Sudan dị afọ atọ agha obodo malitere
Lekwa etu ọnọdụ mba Sudan dị afọ atọ agha obodo malitere
Lekwa etu ọnọdụ mba Sudan dị afọ atọ agha obodo malitere
Nkọwa foto, Lekwa etu ọnọdụ mba Sudan dị afọ atọ agha obodo malitere
    • Onye dere ya, Marvelous Obomanu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist

Ụbọchị Tọzde abalị iri na ise nke ọnwa Eprelụ afọ 2026 ga-eme ya afọ atọ agha malitere na mba Sudan.

Agha ahụ bụ nke dị n'etiti ndịagha Sudan bụ 'Sudanese Armed Forces' nke Ọchịagha Abdel Fattah al-Burhan duru nakwa ndị agha nnupụisi 'Rapid Support Forces nke ọchịagha Mohamed Hamdan Dagalo na-edu.

Ihe kpaliri ọgụ n'etiti ndịagha ndị a bụ enweghị nkwekọrịta ịnabata ndịagha 'Rapid Support Forces' ka ha sonye ndịagha mba Sudan nakwa inyefe ọchịchị site n'aka ndịagha nye ndị nkịtị.

Ọdịda nke obodo el-Fasher bụ otu n'ime ihe kachasị njọ n' agha ahụ, nke malitere n' isi obodo Khartoum.

N'oge na-adịghị anya, ọ gbasaara n'akụkụ ndị ọzọ nke mba ahụ ma dị njọ karịsịa na mpaghara ọdịda anyanwụ nke Darfur, ebe RSF gbanyere mgbọrọgwụ.

Agha ahụ kpalitere nsogbu ndị gbara ọsọndu nke butere ọtụtụ mmadụ inwe mkpa enyemaka.

Atụmatụ udo e wepụtara n'ọnwa Sepụtemba afọ 2025 enwebeghị ezigbo mkpụrụ ọ mitara.

Etu ọ dị ugba, ụfọdụ ndị amaala Sudan gbasara ka úkpaka ebe niile n'ihe etu ihe si kwụrụ na Mba ha.